Ndi-Hibru Chapter 3

For English

Read Ndi-Hibru Chapter 3 Online

Read Ndi-Hibru Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi-Hibru and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ndi-Hibru 3

Isi 3

1. Ya mere, umu-nnam di nsọ, ndi nketa nke ọkpukpọ nke elu-igwe, tugharinu uche n'Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà nke nkwuputa-ayi, bú Jisus;

2. na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n'èzi-na-ulo-Ya dum.

3. N'ihi na aguwo Onye a n'Onye kwesiri otuto kari Moses, n'uzọ na otú ahu onye luru èzi-na-ulo nwere nsọpuru kari èzi-na-ulo-ya.

4. N'ihi na èzi-na-ulo ọ bula nwere onye luru ya; ma Onye luru ihe nile bu Chineke.

5. Ọ bu kwa ezie na Moses kwesiri ntukwasi-obi n'èzi-na-ulo-Ya dum dika onye nēje ozi, ka ọ buru ihe-àmà nke ihe nile agaje ikwu;

6. ma Kraist kwesiri ntukwasi-obi dika Ọkpara, Nke bu onye-isi n'èzi-na-ulo-Ya; Onye ayi onwe-ayi bu èzi-na-ulo-Ya, ma ọ buru na ayi jidesie nkwuwa-okwu-ayi na inya-isi nke olile-anya-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile.

7. N'ihi nka, dika Mọ Nsọ nāsi, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya,

8. Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu, Dika emere n'ubọchi ọnwunwa ahu n'ọhia,

9. Ebe nna-unu-hà nwaram na nnwaputa ikem, Hu kwa ọlum ọgu arọ abua.

10. N'ihi nka ọnuma dim n'obi megide ọb͕ọ a, M'we si, Ha nējehie mb͕e nile n'obi-ha: Ma ndi ahu amaghi uzọm nile;

11. Dika M'ṅuru iyí n'iwe m si, Ha agaghi-abà n'izu-ikem ma-ọli.

12. Lezienu anya, umu-nnam, ka ajọ obi nke ekweghi-ekwe ghara idi nime onye ọ bula n'etiti unu ma eleghi anya, n'iwezuga onwe-ya n'ebe Chineke di ndu nọ:

13. kama nāriọritanu ibe-unu aririọ kwa-ubọchi, n'ogologo oge a anākpọ ya Ta; ka obi onye ọ bula n'etiti unu ghara ime etili site n'aghughọ nke nmehie:

14. n'ihi na ayi aghọwo ndi nketa nke Kraist, ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi jidesiri nmalite nke ndabere-ayi ike rue ọgwugwu ihe nile:

15. n'oge anēkwu, si, Ta, ọ buru na unu gānu olu-Ya, Unu emela ka obi-unu sie ike, dika n'ikpasu-obi-ilu ahu.

16. N'ihi na òle ndi, mb͕e ha nuru, kpasuru obi-ilu? ọ̀ bughi kwa ndi nile ndi siri n'Ijipt puta site n'aka Moses?

17. Ma òle ndi ka ọnuma di Ya n'obi megide ọgu arọ abua? ọ̀ bughi ndi mehiere, ndi ozu-ha dara nime ọhia?

18. Ma òle ndi ka Ọ ṅuru iyi na ha agaghi-abà n'izu-ike-Ya, ma ọ bughi ndi nēkweyeghi?

19. Ayi riba-kwa-ra ama na ha apughi ibà nime n'ihi ekweghi-ekwe.

About Ndi-Hibru Chapter 3

Read Ndi-Hibru Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi-Hibru in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ndi-Hibru
Chapter: 3
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi-Hibru. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ndi-Hibru Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ndi-Hibru Chapter 3?

Ndi-Hibru Chapter 3 is part of the Book of Ndi-Hibru in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ndi-Hibru Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 7

Explore More from ndi-hibru

  1. Ndi-Hibru Chapter 8
  2. Ndi-Hibru Chapter 4
  3. Ndi-Hibru Chapter 1
  4. Ndi-Hibru Chapter 6
  5. Ndi-Hibru Chapter 10
  6. Ndi-Hibru Chapter 13
  7. Ndi-Hibru Chapter 5

Related Chapters & Readings

  1. II. Ihe Emere Chapter 28
  2. I. Jọn Chapter 1
  3. Aisaia Chapter 22
  4. Aisaia Chapter 35
  5. Levitikọs Chapter 18
  6. Zekaraia Chapter 4
  7. Nkpugh Chapter 3
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *