Read Ọpupu Chapter 9 Online
Read Ọpupu Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọpupu in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ọpupu and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ọpupu 9
Isi 9
1. Jehova we si Moses, Bakuru Fero, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.
2. N'ihi na, ma ọ buru na gi onwe-gi nāju izipu ha, ma i nējigide ha,
3. le, aka Jehova di n'aru anu-ulo-gi nke di n'ọhia, n'aru inyinya-gi nile, na n'aru inyinya-ibu-gi nile, na n'aru camel-gi nile, na n'aru ìgwè ehi-gi, na n'aru ìgwè ewu na aturu-gi: ajọ ọria nke nēfe efe, nke di arọ́ nke-uku, gādi.
4. Jehova gākpa ókè n'etiti anu-ulo Israel na anu-ulo Ijipt: ọ dighi ihe gānwupu n'ihe nile umu Israel nwere.
5. Jehova we debe mb͕e akara àkà, si, Echi ka Jehova gēme ihe a n'ala nka.
6. Jehova we me ihe ahu n'echi-ya, anu-ulo Ijipt nile we nwua: ma nime anu-ulo umu Israel ọ dighi otù nwupuru.
7. Fero we ziga, ma, le, ọ dighi ma ọbuná otù nwupuru nime anu-ulo Israel. Obi Fero we di arọ́, o zipughi kwa ndi Israel.
8. Jehova we si Moses na Eron, Kporonu n'onwe-unu ntu oké ọku nju aka abua, ka Moses wu kwa ya n'iru elu-igwe n'anya Fero.
9. Ọ gāghọ uzuzu ntà n'elu ala Ijipt nile, ọ gāghọ kwa etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu, n'ala Ijipt nile.
10. Ha we kporo ntu oké ọku, guzo n'iru Fero; Moses we wua ya n'iru elu-igwe; o we ghọ ihe etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu.
11. Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n'iru Moses, n'ihi ihe-ofifi ahu; n'ihi na ihe-etuto ahu di n'aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n'aru ndi Ijipt nile.
12. Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses.
13. Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.
14. N'ihi na ọ bu na mb͕e a ka Mu gaje izite ihe-otitim nile n'obi-gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi; ka i we mara na ọ dighi onye di kam n'uwa nile.
15. N'ihi na ub͕u a M'gēsetipuwori akam, were ajọ ọria nēfe efe tib͕u gi na ndi-gi, ewe zopu gi n'uwa:
16. ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile.
17. Ì nọ nātuli onwe-gi elu dika obo-ihe imegide ndim rue ub͕u a, na i gaghi-ezipu ha?
18. Le, dika mb͕e a echi M'gaje ime ákú-miri-ígwé di arọ́ nke-uku ka o zo, nke ákú-miri-ígwé dika ya nādighi n'Ijipt site n'ubọchi atọrọ ntọ-ala-ya we rue ub͕u a.
19. Ma ub͕u a, ziga, me anu-ulo-gi na ndi nile i nwere n'ọhia ka ha laghachi n'ulo ọsọsọ; madu ọ bula na anumanu ọ bula nke agāhu n'ọhia, nke agaghi-achikọta ha n'ulo, ákú-miri-ígwé ahu gādakwasi ha, ha we nwua.
20. Onye nātu egwu okwu Jehova n'etiti ndi-orù Fero mere ndi-orù-ya na anu-ulo-ya ka ha b͕aghachi n'ulo:
21. ma onye nētiyeghi obi-ya n'okwu Jehova rapuru ndi-orù-ya na anu-ulo-ya n'ọhia.
22. Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ákú-miri-ígwé we di n'ala Ijipt nile, n'aru madu, na n'aru anumanu, na n'aru ihe-ọkukú ọ bula nke ubi, n'ala Ijipt.
23. Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'iru elu-igwe: Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na ákú-miri-ígwé, ọku we nējeru ala; Jehova we me ka ákú-miri-ígwé zokwasi ala Ijipt.
24. Ákú-miri-ígwé we di, ọku nānwude kwa onwe-ya n'etiti ákú-miri-ígwé ahu, di arọ́ nke-uku, nke ihe dika ya nādighi n'ala Ijipt nile site na mb͕e ọ ghọrọ mba.
25. Ákú-miri-ígwé ahu we tib͕ue ihe nile nke di n'ọhia, ma madu ma anumanu, n'ala Ijipt nile; ọ bu kwa ihe-ọkukú nile ọ bula nke ubi ka ákú-miri-ígwé ahu tiri, ọ bu kwa osisi nile ọ bula nke ọhia ka o tipiara.
26. Nání n'ala Goshen, ebe umu Israel nọ, ka ákú-miri-ígwé nādighi.
27. Fero we zìe, kpọ Moses na Eron, si ha, Emehiewom ub͕u a: Jehova bu onye ezi omume, ma mu onwem na ndim bu ndi nēmebi iwu.
28. Riọnu Jehova; n'ihi na o zuwo, bú olu Chineke na ákú-miri-ígwé ndia; m'gēzipu kwa unu, unu agaghi-eguzo kwa ọzọ.
29. Moses we si ya, Mb͕e m'si n'obodo pua, M'gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa.
30. Ma gi onwe-gi na ndi-orù-gi, amawom na unu akātughi egwu iru Jehova, bú Chineke.
31. Eti-kwa-ra flax na ọka barley: n'ihi na ọka barley nāra oko, flax nāma ifuru.
32. Ma etighi ọka wheat na ọka spelt: n'ihi na ihe ahu etoghi.
33. Moses we si n'ebe Fero nọ, si n'obodo, pua, ọ we b͕asara Jehova ọbu-aka-ya abua: éb͕è-elu-igwe nile na ákú-miri-ígwé we kwusi, awusighi miri-ozuzo n'ala.
34. Fero we hu na miri-ozuzo na ákú-miri-ígwé na éb͕è-elu-igwe kwusiri, ọ we mehie ọzọ, me ka obi-ya di arọ́, ya na ndi-orù-ya.
35. Ewe me ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel; dika Jehova kwuru site n'aka Moses.
About Ọpupu Chapter 9
Read Ọpupu Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ọpupu in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ọpupu
Chapter: 9
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ọpupu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ọpupu Chapter 9 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ọpupu Chapter 9?
Ọpupu Chapter 9 is part of the Book of Ọpupu in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ọpupu Chapter 9 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Eklisiastis Chapter 2
Explore More from ọpupu
- Ọpupu Chapter 27
- Ọpupu Chapter 16
- Ọpupu Chapter 11
- Ọpupu Chapter 28
- Ọpupu Chapter 23
- Ọpupu Chapter 8
- Ọpupu Chapter 34