Matiu Chapter 8

For English

Read Matiu Chapter 8 Online

Read Matiu Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Matiu and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Matiu 8

Isi 8

1. Ma ka O siri n'ugwu ahu ridata, oké ìgwè madu soro Ya.

2. Ma le, onye-ekpenta biakutere Ya. nākpọ isi ala nye Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ọcha.

3. O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ewe me ka ọ di ọcha n'ekpenta-ya.

4. Jisus we si ya, Lezi anya ka i ghara igwa onye ọ bula okwu; ma laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke onyinye ahu Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà.

5. Mb͕e Ọ batara na Kapanaum, otù ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise biakutere Ya, nāriọ Ya,

6. si, Onye-nwe-ayi, onye nējerem ozi tọb͕ọrọ n'ulom, akuku-aru-ya nwuru anwu, anēmekpa ya aru gabiga ókè.

7. O we si ya, Mu onwem gābia me ka aru di ya ike.

8. Ma ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise zara, si, Onye-nwe-ayi, erughm ka I ba n'okpuru ulom: kama were nání okwu-ọnu kwue, agēme kwa ka aru onye nējerem ozi di ike.

9. N'ihi na mu onwem bu kwa onye nọ n'okpuru ike, nēnwe ndi-agha n'okpuru mu onwem: m'we si onye a, Ga, ọ ga; m'si kwa onye ọzọ, Bia, ọ bia; m'si kwa orùm, Me nka, o me ya.

10. Ma mb͕e Jisus nuru nka, o juru Ya anya, Ọ, we si ndi n'eso ya n'azu, N'ezie asim unu, Ọ dighi mb͕e M'huru oké okwukwe di otú a n'aru onye ọ bula n'Israel.

11. Ma asim unu, na ọtutu madu gēsi n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu bia, so kwa Abraham, na Aisak, na Jekob, nānọdu n'ala-eze elu-igwe:

12. ma agāchupu umu ala-eze ahu bà n'ọchichiri nke èzí: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi.

13. Jisus we si ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, Laba; dika i kwere, ka emere gi. Ewe me ka aru onye nējere ya ozi di ike n'oge hour ahu.

14. Mb͕e Jisus batasiri n'ulo Pita, O we hu nne nwunye-ya ka ọ tọb͕ọrọ n'aru-ọku.

15. O we metu aka-ya, aru-ọku ahu we rapu ya; o we bilie, nēje-kwa-ra Ya ozi.

16. Ma mb͕e o ruru anyasi, ha kutara Ya ọtutu madu ndi mọ ọjọ ji: O we were okwu-ọnu chupu ndi-mọ ahu, me kwa ndi nile aru nādighi nma ka aru-ha di ike:

17. ka okwu ekwuru site n'ọnu Aisaia onye-amuma we mezu, si, Ya onwe-ya nara nriaria nile ayi, būru kwa ọria nile ayi.

18. Ma mb͕e Jisus huru na ọtutu ìgwè madu di Ya buruburu, O kwuru ka ha gabiga n'ofè ọzọ.

19. Otù ode-akwukwọ we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, m'gēso Gi ebe ọ bula I nēje.

20. Jisus we si ya, Nkita-ọhia nwere ọnu ha nēdina, anu-ufe nke elu-igwe nwe-kwa-ra ebe ha nāraru ura; ma Nwa nke madu enweghi ebe itọb͕ọ isi-Ya.

21. Onye ọzọ n'etiti ndi nēso uzọ-Ya we si Ya, Onye-nwe-ayi, kwe ka m'buru uzọ je lìe nnam.

22. Ma Jisus si ya, Som; rapu kwa ndi nwuru anwu ka ha lìe ndi nke ha ndi nwuru anwu.

23. Mb͕e Ọ batara n'ub͕ọ, ndi nēso uzọ-Ya we so Ya.

24. Ma le, oké ajọ ifufe febe n'oké osimiri, ya mere ebili-miri nēkpuchi ub͕ọ-ha: ma Ya onwe-ya nāraru ura.

25. Ha we biakute Ya, kpọte Ya, si, Onye-nwe-ayi, zọputa ayi; ayi nāla n'iyì.

26. O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ, unu ndi okwukwe ntà? Mb͕e ahu O biliri, bara ifufe na oké osimiri ahu nba; oké ndaju we di.

27. Ibobo we nwua ndi ahu n'aru, ha si, Àha madu gini ka Onye a bu, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?

28. Mb͕e Ọ gabigasiri n'ofè ọzọ n'ala ndi Gadara, ndikom abua ndi mọ ọjọ ji we zute Ya, ndi nēsi n'ebe anēlì ozu puta, ndi anya-ha di oké egwu, ya mere ọ dighi onye ọ bula nwere ike igabiga uzọ ahu.

29. Ma le, ha tiri nkpu, si, Gini ka ayi na Gi nwekọrọ, Gi Ọkpara Chineke? Ì biara ebe a imekpa ayi aru mb͕e oge-ayi akērughi?

30. Ma ìgwè nke ọtutu ezì di n'ebe di anya n'ebe ha nọ, nāta nri.

31. Ndi-mọ ọjọ ahu we riọ Ya, si, Ọ buru na I chupuru ayi, ziga ayi nime ìgwè ezì ahu.

32. O we si ha, Labanu. Ha we puta, je ba n'ìgwè ezì ahu: ma le, ìgwè ezì ahu nile nudara n'ebe ahu di nkputankpu dabà n'oké osimiri, nwua nime miri.

33. Ndi nāzù ha we b͕alaga, we je ba n'obodo ahu, kọsa ihe nile, ya na ihe mere ndi ahu ndi-mọ ọjọ ji.

34. Ma le, obodo ahu nile putara izute Jisus: ma mb͕e ha huru Ya, ha riọrọ Ya ka Ọ pua n'ókè-ala-ha.

About Matiu Chapter 8

Read Matiu Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Matiu in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Matiu
Chapter: 8
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Matiu. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Matiu Chapter 8 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Matiu Chapter 8?

Matiu Chapter 8 is part of the Book of Matiu in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Matiu Chapter 8 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from matiu

  1. Matiu Chapter 10
  2. Matiu Chapter 22
  3. Matiu Chapter 17
  4. Matiu Chapter 18
  5. Matiu Chapter 6
  6. Matiu Chapter 24
  7. Matiu Chapter 21

Related Chapters & Readings

  1. Hosea Chapter 10
  2. Jọn Chapter 2
  3. Jeremaia Chapter 31
  4. Jeremaia Chapter 27
  5. Jọn Chapter 4
  6. Ndi-Ikpe Chapter 16
  7. Levitikọs Chapter 26
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *