Read I. Ndi-Eze Chapter 3 Online
Read I. Ndi-Eze Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi-Eze in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Ndi-Eze and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
I. Ndi-Eze 3
Isi 3
1. Solomon we ghọ ọgọ Fero eze Ijipt, kuru nwa-nwayi Fero, me ka ọ bata n'obodo Devid, rue mb͕e o wusiri ulo-ya, na ulo Jehova, na mb͕idi Jerusalem buruburu.
2. Nání na ndi Israel nāchu àjà n'ebe nile di elu, n'ihi na ọ dighi ulo ewuru aha Jehova rue mb͕e ahu.
3. Ma Solomon huru Jehova n'anya, nēje ije n'ukpuru nile nke Devid, bú nna-ya: ọ bu nání na ya onwe-ya nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu.
4. Eze we jerue Gibeon ichu àjà n'ebe ahu; n'ihi na nke ahu bu oké ebe di elu: nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri ka Solomon surere n'elu ebe-ichu-àjà ahu.
5. Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi.
6. Solomon we si, Gi onwe-gi emeworo orù-Gi, bú Devid nnam, ebere uku, dika o jere ije n'iru Gi n'ezi-okwu na n'ezi omume, na nime obi ziri ezi n'ebe I nọ; I we debere ya ebere uku a, nye ya nwa-nwoke nke nānọkwasi n'oche-eze-ya, dika ọ di ta.
7. Ma ub͕u a, Jehova, bú Chinekem, Gi onwe-gi emewo orù-Gi eze n'ọnọdu Devid, bú nnam: ma mu onwem bu nwatakiri; amaghm ipu apu na ibata abata.
8. Orù-Gi nọ kwa n'etiti ndi-Gi I rọputaworo, ndi bara uba, ndi anādighi-aguta ha, ndi anādighi-agu kwa ha ọnu, n'ihi iba-uba-ha.
9. Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?
10. Okwu-ya we di nma n'anya Onye-nwe-ayi, na Solomon riọrọ ihe a.
11. Chineke we si ya, N'ihi na i riọrọ ihe a, ma i riọghi nye onwe-gi ọtutu ubọchi; i riọghi kwa àkù nye onwe-gi, i riọghi kwa ndu ndi-iro-gi; kama i riọworo onwe-gi nghọta inu ikpé;
12. le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.
13. Ọzọ kwa, enyewom i ihe i nāriọghi, ma àkù ma nsọpuru, ya mere ọ dighi nwoke ọ bula n'etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile.
14. Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.
15. Solomon we teta, ma, le, ọ bu nrọ: o we bata na Jerusalem, guzo n'iru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Onye-nwe-ayi, sure àjà-nsure-ọku, chua àjà-udo, mere ndi-orù-ya nile oké oriri.
16. Mb͕e ahu ndinyom abua, bú ndi nākwa iko, biakutere eze, guzo n'iru ya.
17. Otù nwayi we si, Biko, onye-nwem, Mu onwem na nwayi a nēbi n'otù ulo; m'we mua nwa mb͕e mu na ya nọ n'ulo.
18. O rue, n'ubọchi nke-atọ mb͕e m'musiri nwa, na nwayi a mu-kwa-ra nwa; ayi onwe-ayi nọ kwa n'otù ebe; ọ dighi onye ala ọzọ ayi na ya nọ n'ulo, nání ayi abua nọ n'ulo.
19. Nwa nwayi a we nwua n'abali; n'ihi na o dinakwasiri ya.
20. O we bilie n'etiti abali, kupu nwam n'akukum, ma orù-gi nwayi nāraru ura, o we dọba ya n'obi-ya, ma nwa-ya nke nwuru anwu ka ọ dọbara n'obim.
21. M'we bilie n'ututu inye nwam ara, ma, le, ọ nwuwo: m'we tule ya n'ututu, ma, le, ọ bughi nwam nke m'muru.
22. Nwayi nke-ọzọ we si, É-è; kama nke di ndu bu nwam, nke nwuru anwu bu kwa nwa-gi. Ma nke-mbu nāsi, É-è; kama nke nwuru anwu bu nwa-gi, nke di ndu bu kwa nwam. Ha we kwue otú a n'iru eze.
23. Eze we si, Otù nwayi nāsi, Nka nke di ndu bu nwam, ma nwa-gi bu nke nwuru anwu: ma nke-ọzọ nāsi, É-è; kama nwa-gi bu nke nwuru anwu, ma nwam bu nke di ndu.
24. Eze we si, Wetaram mma-agha. Ha we weta mma-agha n'iru eze.
25. Eze we si, Kpọwanu nwa di ndu abua, nye otù nwayi otù nkera, nye kwa nwayi nke-ọzọ nkera ọzọ.
26. Nwayi ahu nke nwere nwa di ndu we si eze, (n'ihi na afọ chighariri ya n'aru nwa-ya,) o we si, Biko, onye-nwem, nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli. Ma nwayi nke-ọzọ nāsi, M'gaghi-enwe ya, i gaghi-enwe kwa ya; kpọwanu ya.
27. Eze we za, si, Nyenu ya nwa di ndu, unu eme-kwa-la ka ọ nwua ma-ọli: nwayi a bu nne-ya.
28. Israel nile we nu ikpe eze kpere; ha we tua egwu eze: n'ihi na ha huru na amam-ihe Chineke di nime ya, ime ihe ekpere n'ikpe.
About I. Ndi-Eze Chapter 3
Read I. Ndi-Eze Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi-Eze in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: I. Ndi-Eze
Chapter: 3
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Ndi-Eze. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading I. Ndi-Eze Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is I. Ndi-Eze Chapter 3?
I. Ndi-Eze Chapter 3 is part of the Book of I. Ndi-Eze in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete I. Ndi-Eze Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Eklisiastis Chapter 2
Explore More from i-ndi-eze
- I. Ndi-Eze Chapter 11
- I. Ndi-Eze Chapter 2
- I. Ndi-Eze Chapter 20
- I. Ndi-Eze Chapter 21
- I. Ndi-Eze Chapter 19
- I. Ndi-Eze Chapter 13
- I. Ndi-Eze Chapter 5