Luk Chapter 20

For English

Read Luk Chapter 20 Online

Read Luk Chapter 20 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Luk in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Luk and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Luk 20

Isi 20

1. O we rue, n'otù nime ubọchi ahu, mb͕e Ọ nēzí ndi-Ju ihe n'ulo uku Chineke, nēzì kwa ozi ọma, na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ, ha na ndi-okenye, we guzo Ya nso;

2. ha we kwue, si Ya, Gwa ayi: Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye ka ọ bu, bú onye nyere Gi ike a?

3. Ma Ọ zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù ajuju unu zakwam:

4. Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n'aka madu?

5. Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gāsi, N'ìhi gini ka unu nējighi kwe ya?

6. Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ndi-Ju nile gēji nkume tub͕u ayi: n'ihi na emewo ka ha kweye na Jọn bu onye-amuma.

7. Ha we za, si na ha amataghi ebe o sitere.

8. Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.

9. O we malite ituru ndi-Ju ilu a: Otù onye kuru ubi-vini, were kwa ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ nọdu oge di anya.

10. N'oge ighọ nkpuru o we zigara ndi-ọlu-ubi ahu otù orù, ka ha we nye ya nkpuru ufọdu nke ubi-vine ahu: ma ndi-ọlu-ubi ahu piara ya ihe, zilaga ya n'aka efu.

11. O we zikwasi orù ọzọ: ha we pia kwa ya ihe, me ya ihe-ihere, zilaga ya n'aka efu.

12. O we zikwasi orù nke-atọ: ha we meru kwa onye ahu aru, we tupu ya.

13. Onye-nwe ubi-vine ahu we si, Gini ka m'gēme? m'gēziga ọkparam m'huru n'anya: eleghi anya ha gāsọpuru nwam nka.

14. Ma mb͕e ndi-ọlu-ubi ahu huru ya, ha kwurita n'etiti onwe-ha, si, Nka bu onye-nketa: ka ayi b͕ue ya, ka ihe-nketa-ya we buru nke ayi.

15. Ha we tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Gini kwa ka onye-nwe ubi-vine ahu gēme ha?

16. Ọ gābia, la ndi-ọlu-ubi ahu n'iyì, were kwa ubi-vine ahu nye ndi ọzọ. Ma mb͕e ha nuru ya, ha si, Chineke ekwela.

17. Ma O lere ha anya, si, Gini kwa bu ihe a nke edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo?

18. Agētiwasi onye ọ bula nke dakwasiri nkume ahu; ma onye ọ bula ọ gādakwasi ya, ọ gēfesa ya ka uzuzu.

19. Ndi-ode-akwukwọ na ndi-isi-nchu-àjà we chọ uzọ itukwasi Ya aka n'otù oge hour ahu; ma ha turu egwu ndi-Ju: n'ihi na ha mara na Ọ turu ilu a imegide ha.

20. Ha we che Ya nche, we zipu ndi-nledo, ndi mere onwe-ha dika ndi ezi omume, ka ha we jide Ya n'okwu-ọnu-Ya, irara Ya nye n'aka ọchichi na ike nke onye-isi.

21. Ha we jua Ya, si, Onye-ozizí, ayi amatawo na I nēkwu nēzi kwa ihe ziri ezi, na I dighi-ele kwa madu anya n'iru, kama I nēzí uzọ Chineke n'ezi-okwu:

22. Ò ziri ezi n'iwu ka ayi tu ùtú nye Sisa, ma-ọbu na ò zighi ezi?

23. Ma Ọ matara aghughọ-ha, we si ha,

24. Gosinum otù shilling. Ònyinyo na ihe-ndekwasi nke onye ka o nwere? Ha si, Nke Sisa.

25. O we si ha, Ya mere, nyeghachinu Sisa ihe nke Sisa, nyeghachi-kwa-nu Chineke ihe nke Chineke.

26. Ha enweghi kwa ike ijide okwu-Ya n'iru ndi-Ju: ọziza-Ya we ju ha anya, ha we kpuchie ọnu-ha.

27. Ufọdu n'etiti ndi-Sadusi, ndi si na nbilite-n'ọnwu adighi, we biakute Ya; ha we jua Ya,

28. si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, na ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, mb͕e o nwere nwunye, ma onye ahu enweghi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.

29. Ya mere, umu-nne-ndikom asa di: nke-mbu luru nwunye, we nwua nēnweghi nwa;

30. nke-abua kwa;

31. nke-atọ we kuru ya; otú ahu ha asa arapughi umu, we nwua.

32. Mb͕e ha nile nwusiri nwanyi ahu nwukwara.

33. Ya mere, na nbilite-n'ọnwu nwùnye onye n'etiti ha ka ọ gābu? n'ihi na ha asa nwere ya na nwunye.

34. Jisus we si ha, Umu nke oge a nālu nwunye, anēnye kwa ha n'ọlulu-di:

35. ma ndi aguru na ha kwesiri iru oge ahu, na iru nbilite-n'ọnwu ahu, bú isi na ndi nwuru anwu bilie, ha alughi nwunye, enyeghi kwa ha n'ọlulu-di:

36. n'ihi na ha apughi kwa inwu ọzọ: n'ihi na ha na ndi-mọ-ozi ra; ha bu kwa umu Chineke, ebe ha bu umu nbilite-n'ọnwu ahu.

37. Ma ọbuná Moses gosiri na anēme ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, nēkwu nime ebe edere okwu bayere Osisi ntà, mb͕e ọ nākpọ Onye-nwe-ayi Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob.

38. Ma Ọ bughi Chineke nke ndi nwuru anwu, kama Ọ bu nke ndi di ndu: n'ihi na ọ bu n'ebe Ọ nọ ka madu nile di ndu.

39. Ufọdu n'etiti ndi-ode-akwukwọ we za, si, Onye-ozizí, I kwuru nke-ọma.

40. N'ihi na ha enweghi anya-ike ọzọ iju Ya ajuju ọ bula.

41. O we si ha, Hà si aṅa kwu na Kraist ahu bu nwa Devid?

42. N'ihi na Devid onwe-ya nēkwu n'akwukwọ Abù ọma, si, Onye-nwe-ayi siri Onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim,

43. Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwu-Gi abua.

44. Ya mere, Devid nākpọ Ya Onye-nwe-ya, Ò si kwa aṅa buru Nwa-ya?

45. Ma mb͕e ndi-Ju nile nānu okwu-Ya Ọ si ndi nēso uzọ-Ya,

46. Nēzenu ndi-ode-akwukwọ, ndi nāchọ ijeghari n'uwe-nwuda, ndi nāhu kwa ekele n'ọma-ahia nile unu n'anya, na isi oche nile n'ulo-nzukọ nile unu, na isi ọnọdu n'oriri nile unu;

47. ndi nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru, ndi nēkpe kwa ogologo ekpere ka madu we hu ha anya: ndia gēnwe ezi ọmuma-ikpé gabigara ókè kari ndi ọzọ.

About Luk Chapter 20

Read Luk Chapter 20 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Luk in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Luk
Chapter: 20
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Luk. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Luk Chapter 20 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Luk Chapter 20?

Luk Chapter 20 is part of the Book of Luk in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Luk Chapter 20 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 1
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from luk

  1. Luk Chapter 7
  2. Luk Chapter 13
  3. Luk Chapter 22
  4. Luk Chapter 16
  5. Luk Chapter 8
  6. Luk Chapter 6
  7. Luk Chapter 9

Related Chapters & Readings

  1. Jeremaia Chapter 16
  2. Levitikọs Chapter 13
  3. Ilu Chapter 7
  4. Matiu Chapter 16
  5. Esta Chapter 3
  6. Hosea Chapter 9
  7. Jenesis Chapter 2
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *