Read Mak Chapter 15 Online
Read Mak Chapter 15 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Mak and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Mak 15
Isi 15
1. Ngwa ngwa n'ututu ndi-isi-nchu-àjà, ha na ndi-okenye na ndi-ode-akwukwọ, na nnọkọ-ikpé dum, b͕ara ìzù, we ke Jisus ab͕u, kupu Ya je, rara Ya nye n'aka Pailat.
2. Pailat we jua Ya, si, Gi onwe-gi bu Eze ndi-Ju? O we za ya, si, Gi onwe-gi kwuru.
3. Ndi-isi-nchu-àjà we nēbo Ya ọtutu ebubo.
4. Pailat we ju kwa Ya ọzọ, si, Ì zaghi ihe ọ bula? le ka ọtutu ihe ha nēbo Gi ra.
5. Ma Jisus azaghi ihe ọ bula ọzọ; ya mere na o juru Pailat anya.
6. Ma n'ememe ọ nārapuru ha otù onye-nkpọrọ, onye ha nāriọ n'aka-ya.
7. Ma otù onye di anākpọ Barabas, onye ekereri ab͕u, ya na ndi biliri imegide ndi-isi, madu ndi b͕u-kwa-ra madu na nbili ahu.
8. Ìgwè madu ahu we rigo, malite iriọ ya ka o me dika ọ nēmere ha.
9. Pailat we za ha, si, Ùnu nāchọ ka m'rapuru unu Eze ndi-Ju?
10. N'ihi na ọ mara na ndi-isi-nchu-àjà rara Ya-ri nye n'ihi ekworo.
11. Ma ndi-isi-nchua-àjà kwaliri ìgwè madu ahu, ka ọ rapuru-ha Barabas kari Jisus.
12. Ma Pailat za kwa-ra ọzọ, si ha, Ọ̀ bu gini ka m'gēme kwa Onye ahu unu nākpọ Eze ndi-Ju?
13. Ma ha ti-kwa-ra nkpu ọzọ, si, Kpọgide Ya n'obe.
14. Pailat we si ha, É-è, n'ihi na Ò mere ihe ọjọ gini? Ma ha tibigara nkpu ókè, si, Kpọgide Ya n'obe.
15. Ma Pailat, ebe ọ nēzube ime ihe gātọ ìgwè madu ahu utọ n'obi, ọ rapuru ha Barabas, o we rara Jisus nye, mb͕e ọ piasiri Ya ihe, ka ewe kpọgide Ya n'obe.
16. Ndi-agha we dupu Ya ga ba n'obí, nke bu Pritoriọm; ha we kpọkọ òtù- ha dum.
17. Ha we yikwasi Ya uwe ododo; mb͕e ha kpasiri okpu-nmeri nke eji ogwu me, ha were ya kpube Ya n'isi;
18. ha we malite ikele Ya, si, Ekele, Eze ndi-Ju!
19. Ha were kwa amì nēti Ya n'isi, ha nābusa kwa Ya ọnu-miri, ha we b͕ue ikperè nākpọ isi ala nye Ya.
20. Mb͕e ha mesiri Ya ihe-ọchì, ha we yipu Ya uwe ododo ahu, we yikwasi Ya uwe-Ya nile. Ha we dupu Ya ka ha kpọgide Ya n'obe.
21. Ha we jide otù onye nke nāgabiga ka o so ha, ka o we būru obe-Ya, bú Saimon onye Sairini, nna Aleksanda na Rufọs, nke si n'azu obodo ahu bia.
22. Ha we kuru Ya bia n'ebe anākpọ Gọlgọta, nke bu, ma asugharia ya, Ebe okpokoro-isi.
23. Ha we che n'iru Ya manya-vine nke agwara myrrh: ma Ọ naraghi ya.
24. Ha we kpọgide Ya n'obe, kè kwa uwe-Ya n'etiti ha, nēfe nzà n'elu ha, nke onye ọ bula gēwe.
25. Ma ọ bu oge hour nke-atọ, ha we kpọgide Ya n'obe.
26. Edekwasi-kwa-ra ndekwasi nke ihe eboro Ya, EZE NDI-JU.
27. Ha kpọgide-kwa-ra ndikom abua tinyere Ya ndi nāpunara madu ihe; otù onye n'aka-nri-Ya, na otù onye n'aka-ekpe-Ya.
28. Ewe mezue ihe edere n'akwukwọ nsọ, nke si, Ọ bu kwa na ndi nēmebi iwu ka aguru Ya.
29. Ndi nāgabiga nēkwulu kwa Ya, nēfufe isi-ha, nāsi kwa, Ehe! Gi Onye nākwatu ulo nsọ ayi, Onye nēwu kwa ya n'ubọchi atọ,
30. zọputa Onwe-gi, si n'elu obe ridata.
31. Otú ahu ka ndi-isi-nchu-àjà nēkwu kwa, ebe ha na ndi-ode-akwukwọ nēme Ya ihe-ọchì n'etiti onwe-ha, si, Ọ zọputara ndi ọzọ; Ọ pughi izọputa Onwe-ya.
32. Ka Kraist, Eze Israel, si n'elu obe ridata ub͕u a, ka ayi we hu kwere kwa. Ndi akpọgidere Ya na ha n'obe nāta kwa Ya uta.
33. Mb͕e o ruru oge hour nke-isi, ọchichiri we b͕a n'ala ahu dum rue oge hour nke-iteghete.
34. N'oge hour nke-iteghete Jisus we were oké olu tie nkpu, si, Eloi, Eloi, lama sabaktani? nke bu, ma asugharia ya, Chinekem, Chinekem, gini mere I ji rapu nání Mu?
35. Ufọdu n'etiti ndi guzoro nso, mb͕e ha nuru ya, ha we si, Le, Ọ nākpọ Elaija
36. Otù onye we b͕a ọsọ, were manya-vine b͕ara uka b͕aju sponge, tukwasi ya n'amì, nye Ya ka Ọ ṅua, si, Rapunu; ka ayi hu ma Elaija nābia iwedata Ya n'obe.
37. Ma Jisus mere ka olu-Ya dasie ike, O we kubìe ume.
38. Ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa iberibe abua site n'elu rue ala.
39. Ma mb͕e ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, nke guzoro nso na ncherita-iru Ya, huru na O kubìri ume otú a, ọ si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.
40. Ndinyom di kwa ndi nọ n'ebe di anya nēkiri: n'etiti ha ka Meri Magdalini, na Meri nne Jemes nke-ntà na Joses, na Salomi, nọ;
41. ndi nēso Ya mb͕e Ọ nọ na Galili, nēje-kwa-ra Ya ozi; na ọtutu ndinyom ọzọ ndi soro Ya rigoro Jerusalem.
42. Mb͕e o ruru anyasi ub͕u a, ebe ọ bu Nkwadebe, nke bu ubọchi buru ubọchi-izu-ike uzọ,
43. Josef nke Arimatia we bia, onye bu onye-nnọkọ-ikpé onye anāsọpuru, onye ya onwe-ya nēche kwa ala-eze Chineke; o were anya-ike bakuru Pailat, riọ aru Jisus.
44. O we ju Pailat anya ma ọ buru na Ọ nwuruwori: o we kpọ ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise biakute ya, ọ jua ya ma ọ di anya mb͕e Ọ nwuru.
45. Mb͕e ọ matara site n'ọnu ọchi-agha ahu nāchi ọgu ndi-agha ise, o we rara ozu Jisus nye Josef n'efu.
46. O we zuta ezi ákwà ọcha; mb͕e o budatasiri Ya, o we ke Ya n'ezi ákwà ọcha ahu, tọb͕ọ Ya n'ílì nke egwuwarari n'oké nkume; o we kpọre otù nkume kwachie ọnu-uzọ ílì ahu.
47. Ma Meri Magdalini na Meri nne Joses huru ebe atọb͕ọrọ Ya.
About Mak Chapter 15
Read Mak Chapter 15 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Mak
Chapter: 15
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Mak. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Mak Chapter 15 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Mak Chapter 15?
Mak Chapter 15 is part of the Book of Mak in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Mak Chapter 15 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6