Read Mak Chapter 7 Online
Read Mak Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Mak and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Mak 7
Isi 7
1. Ha we zukọ n'ebe Ọ nọ, bú ndi-Farisi, na ufọdu nime ndi-ode-akwukwọ, ndi siri na Jerusalem bia,
2. ndi hu-kwa-ra na ufọdu nime ndi nēso uzo-Ya nēri nri-ha n'aka ruru árú, nke ahu bu, aka anākwọghi akwọ.
3. N'ihi na ndi-Farisi, na ndi-Ju nile, ọ buru na ha akwọchaghi aka-ha, ha adighi-eri ihe, n'ihi na ha nējide ozizí nke ndi-okenye nyere ha n'aka idebe:
4. ọzọ, mb͕e ha si n'ahia lata, ọ buru na ha efesaghi onwe-ha miri, ha adighi-eri ihe: ọtutu ihe ọzọ di kwa, nke ha natara ijide, dika ime iko, na ite, na ihe ọla, baptism.
5. Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ we jua Ya, si, N'ìhi gini ka ndi nēso uzọ-Gi nējeghi ije dika ozizí ndi-okenye nyere ayi n'aka idebe, ma ha nēri nri-ha n'aka ruru árú?
6. Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n'isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha, Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.
7. Ma ha nēbirim isi ala n'efu, Nēzí ihe madu nyere n'iwu ka ha buru ozizí-ha.
8. Unu nārapu ihe Chineke nyere n'iwu, jide kwa ozizí madu nyere n'aka-unu idebe.
9. O we si ha, Unu nāju ihe Chineke nyere n'iwu nke-ọma, ka unu we debe ozizí nke enyere n'aka-unu idebe.
10. N'ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu:
11. ma unu onwe-unu nāsi, Ọ buru na madu si nna-ya ma-ọbu nne-ya, Ihe ọ bula i gēritari n'akam bu Kọban, isi-ya bu, Ihe enyere Chineke;
12. unu ekweghi ya ọzo ka o mere nna-ya ma-ọbu nne-ya ihe ọ bula:
13. nēme okwu Chineke ka ọ buru ihe-efu site n'ozizí enyere unu n'aka idebe, nke unu nyere madu n'aka idebe: ọtutu ihe di otú a ka unu nēme kwa.
14. O we kpọ ìgwè madu ahu ọzọ biakute Ya, Ọ si ha, Nurunu okwum, unu nile, ghọta-kwa-nu:
15. ọ dighi ihe ọ bula di madu n'ìhè nke puru imeru ya, ma ọ buru na ọ ba nime ya: kama ihe si nime madu puta bu ihe nēmeru madu.
16. Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.
17. Mb͕e Ọ ghara ìgwè madu ahu ba n'ulo, ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya isi ilu ahu.
18. O we si ha, Ùnu onwe-unu di kwa otú a ka ndi nēnweghi nghọta? Ùnu atugharighi uche-unu, na ihe ọ bula nke si n'ìhè ba nime madu, na ọ pughi imeru ya,
19. n'ihi na ọ bàghi n'obi-ya, kama n'afọ-ya, o we pua n'ulo-ǹsí? O kwuru nka, ka O me ka ihe-oriri nile di ọcha.
20. O we si, Ihe nke si nime madu puta, nke ahu nēmeru madu.
21. N'ihi na n'ime, bú n'obi madu, ka èchìchè nile jọrọ njọ si aputa, ikwa-iko nile, ori nile, ib͕u-madu nile,
22. ikwa-iko nile nke ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di, anya-uku nile, ajọ ihe nile, aghughọ, agu ikwa-iko, ajọ anya, nkwulu, npakọ, enweghi-uche:
23. ajọ ihe ndia nile nēsi nime madu aputa, ha nēmeru madu.
24. O we si n'ebe ahu bilie, je n'ókè-ala Taia na Saidon. O we ba n'ulo, Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara: ma apughi izota Ya.
25. Ma ngwa ngwa otù nwanyi, nke nwa-ya nwanyi nke-ntà nwere mọ nādighi ọcha, ebe ọ nuru ùdé-Ya, ọ bia da n'ala n'ukwu-Ya.
26. Ma nwanyi ahu bu onye-Grik, buru onye Sairo-Finisia n'ọmumu-ya. O we kpere Ya ka Ọ chupu mọ ọjọ ahu n'aru nwa-ya nwanyi.
27. O we si ya, Kwe ka afọ buru uzọ ju umu: n'ihi na ọ dighi nma inara nri umu tupuru umu-nkita.
28. Ma ọ zara, si Ya, E, Onye-nwe-ayi: ọbuná umu-nkita n'okpuru table nēri irighiri ufọdu na nri umu ntà.
29. O we si ya, N'ihi okwu a laba; mo ọjọ ahu apuwo n'aru nwa-gi nwanyi.
30. O we la n'ulo-ya, hu nwatakiri-ya na atọb͕ọrọ ya n'elu ihe-ndina-ya, hu kwa na mọ ọjo ahu apuwori.
31. O si-kwa-ra n'ókè-ala Taia pua ọzọ, we gabiga n'etiti Saidon, si n'etiti ókè-ala Dekapọlis, rue oké osimiri Galili.
32. Ha we kutara Ya otù onye nti chiri, nke nāsu kwa nsu; ha we riọ Ya ka O bikwasi ya aka-Ya.
33. O we si n'igwè madu ahu kupu ya iche, we tiye nkpisi-aka-Ya na nti-ya abua, bu kwa ọnu-miri, metu ire-ya;
34. O we le anya n'elu-igwe, sua udè, si ya, Efata, nke isi-ya bu, Ghere oghe.
35. Nti-ya abua we ghere oghe, ekike ire-ya tọpu kwa, o we kwuzi okwu.
36. O we gwasie ha ike ka ha ghara igwa onye ọ bula: ma ka ọ ra, bú otú Ya onwe-ya gwasiri ha ike, otú a ka ha nēkwusa kari ya nke-uku.
37. Ibobo nwubiga-kwa-ra ha ókè n'aru, ha si, O mewo ihe nile nke-ọma: Ọ nēme ọbuná ndi nti chiri ka ha nu ihe, me kwa ndi nāpughi ikwu okwu ka ha kwue.
About Mak Chapter 7
Read Mak Chapter 7 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Mak
Chapter: 7
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Mak. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Mak Chapter 7 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Mak Chapter 7?
Mak Chapter 7 is part of the Book of Mak in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Mak Chapter 7 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Nkpugh Chapter 4
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 6
- Nkpugh Chapter 7