Mak Chapter 4

For English

Read Mak Chapter 4 Online

Read Mak Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Mak and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Mak 4

Isi 4

1. Ọ we malite ọzọ izí ihe n'usọ oké osimiri. Oké ìgwè madu uku we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕o, we nọdu ala n'osimiri; ìgwè madu ahu nile we nọ n'usọ oké osimiri n'elu ala.

2. O we zí ha ọtutu ihe n'ilu di iche iche, si ha n'ozizí-Ya,

3. Nurunu: Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru:

4. o rue, mb͕e ọ nāgha, ufọdu dara n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tuturie ha.

5. Nkpuru ọzọ we da n'ala nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne; ngwa ngwa ha we pulite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi:

6. ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu.

7. Nkpuru ọzọ we da n'etiti ogwu, ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha, ha amighi kwa nkpuru.

8. Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, nētó nāba kwa uba; ha we mia, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.

9. O we si, Onye nwere nti inu ihe, ya nu.

10. Mb͕e nání Ya nọ, ndi nọ Ya buruburu na ndikom iri na abua ahu we jua Ya ilu ahu.

11. O we si ha, Ọ bu unu ka enyeworo ihe-omimi ala-eze Chineke: ma anēmere ndi nọ n'èzí ihe nile n'ilu:

12. ka ha we hu n'ọhuhu, ghara ihuta; ka ha we nu kwa n'ọnunu, ghara inuta; ka ha ghara ichighari mb͕e ọ bula, ewe gb͕aghara ha.

13. O we si ha, Ùnu amataghi ilu a? ùnu gēsi kwa aṅa mara ilum nile?

14. Ọgha-nkpuru nāgha okwu Chineke.

15. Ma ndia bu ndi nọ n'akuku uzọ ahu, ebe anāgha okwu ahu; ma mb͕e ọ bula ha nuru, ngwa ngwa Setan abia, we napu okwu nke aghaworo nime ha.

16. Otú ahu, ndia bu kwa ndi anāgha n'ebe nkume ahu, ndi, mb͕e ọ bula ha nuru okwu ahu, ngwa ngwa ha were ọṅù jide ya;

17. ma ha enweghi nkpọrọgwu nime onwe-ha, kama ha nānọ nwa oge; emesia, mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ha ma n'ọnyà.

18. Ndi ọzọ bu kwa ndi anāgha n'etiti ogwu ahu; ndia bu ndi nuru okwu ahu,

19. ma ncheb͕u nile nke oge a, na aghughọ nke àkù, na nbata nke agu ihe di iche iche ọzọ, nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru.

20. Ndi ahu bu kwa ndi aghara n'ala ahu di nma; ndi ọ bula ndi nānu okwu ahu, we nara ya, we mia nkpuru, otù orú na iri, ọzọ ọgu atọ, ọzọ ọgu ise.

21. O we si ha, Ànēbute oriọna ka adọba ya n'okpuru mb͕é', ma-ọbu n'okpuru ihe-ndina? ọ̀ bughi ka adọba ya n'elu ihe-idọba-oriọna?

22. N'ihi na ọ dighi ihe ezoro ezo, ma-ọbughi ka ewe me ka ọ puta ìhè; ọ dighi kwa ihe emere ka ọ buru ihe ezoro ezo, kama ọ bu ka o we puta ìhè.

23. Ọ buru na onye ọ bula nwere nti inu ihe, ya nu.

24. O we si ha, Lezienu anya ihe unu nānu: ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu: agēnye kari kwa unu.

25. N'ihi na onye nwere, onye ahu ka agēnye: onye nēnweghi kwa, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.

26. O we si, ọ bu otu a ka ala-eze Chineke di, ọ di ka mb͕e madu tupuru nkpuru n'ala;

27. we raru ura teta kwa abali na ehihie, nkpuru ahu we pue tó kwa, onye ahu amaghi ka o si me.

28. Ala nāmi nkpuru site n'onwe-ya; mbu npute, emesia oko, emesia ọka kara aka n'oko.

29. Ma mb͕e ọ bula nkpuru chara, ngwa ngwa o were mma-iwe-ihe-ubi webe, n'ihi na mb͕e owuwe-ihe-ubi abiawo.

30. O we si, Ayi gēsi aṅa tunyere ala-eze Chineke? ma-ọbu n'ìlu gini ka ayi gātu ya?

31. Ọ di ka nkpuru mustard, nke, mb͕e ọ bula aghara ya n'ala, ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile di n'ala;

32. ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n'ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n'okpuru ǹdò-ya.

33. O nēji kwa ọtutu ilu di otú a gwa ha okwu Chineke, dika ha puru inu ya:

34. ma asi na O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu: ma mb͕e Ya na ha nọ iche Ọ nākọrọ ndi nke Ya nēso uzọ-Ya ihe nile.

35. N'ubọchi ahu, mb͕e o ruru anyasi, O we si ha, Ka ayi gabiga n'ofè ọzọ.

36. Ha we rapu ìgwè madu ahu, we kuru Ya, otú di, tiyere onwe-ha n'ub͕ọ ahu. Ub͕ọ ufọdu ọzọ di kwa nke nēso Ya.

37. Oké ajọ ifufe we fe, ebili-miri we nāwubà n'ub͕o ahu, ya mere na miri nēju n'ub͕ọ ub͕u a.

38. Ma Ya onwe-ya nọ n'isi ub͕ọ, nāraru ura n'elu ohiri-isi: ha we kpọte Ya, Si Ya, Onye-ozizí, Ò metughi Gi n'obi na ayi nāla n'iyì?

39. O we teta, bara ifufe nba, si kwa oké osimiri, Di jū, kpuchie ọnu-gi. Ifufe we febìe, oké ndaju we di.

40. O we si ha, Gini mere unu nātu ujọ? ùnu akēnweghi okwukwe?

41. Ha we tua oké egwu, sirita onwe-ha, Ònye bu kwa onye a, na ọbuná ifufe na oké osimiri nāṅa Ya nti?

About Mak Chapter 4

Read Mak Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Mak
Chapter: 4
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Mak. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Mak Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Mak Chapter 4?

Mak Chapter 4 is part of the Book of Mak in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Mak Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from mak

  1. Mak Chapter 16
  2. Mak Chapter 14
  3. Mak Chapter 5
  4. Mak Chapter 13
  5. Mak Chapter 10
  6. Mak Chapter 11
  7. Mak Chapter 2

Related Chapters & Readings

  1. Aisaia Chapter 60
  2. Job Chapter 42
  3. Ọpupu Chapter 23
  4. Ọnu-Ọgugu Chapter 29
  5. Ọpupu Chapter 36
  6. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 17
  7. Abù Ọma Chapter 1
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *