II. Ndi Kọrint Chapter 6

For English

Read II. Ndi Kọrint Chapter 6 Online

Read II. Ndi Kọrint Chapter 6 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Ndi Kọrint and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

II. Ndi Kọrint 6

Isi 6

1. Ma, dika ndi ayi na Ya nālukọ ọlu, ayi nāriọ kwa unu ka unu ghara inara amara Chineke n'efu,

2. (n'ihi na Ọ nāsi, N'oge anānara madu nke-ọma ka M'nuru olu-gi, Ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'yere gi aka: le, ub͕u a bu oge anānara madu nke-ọma; le, ub͕u a bu ubọchi nzọputa):

3. ayi adighi-eme ihe-isu-ngọngọ ọ bula n'ihe ọ bula, ka aghara ita ije-ozi-ayi uta;

4. kama n'ihe nile ayi nēme ka madu mara ayi, dika ndi nējere Chineke ozi, nime oké ntachi-obi, nime nkpab͕u, nime nkpà, nime oké nkpà,

5. nime ihe-otiti, nime ulo-nkpọrọ, nime aghara, nime idọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nime imuru-anya, nime obubu-ọnu;

6. nime idi-ọcha, nime ihe-ọmuma, nime ogologo ntachi-obi, nime obi-ọma, nime Mọ Nsọ, nime ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya,

7. nime okwu nke ezi-okwu, nime ike nke Chineke; site n'ihe-agha nke ezi omume n'aka-nri na aka-ekpe,

8. site n'otuto na ihe-ihere, site na nhota ọjọ na nhota ọma; dika ndi-nduhie, ma ayi bu ndi ezi-okwu;

9. dika ndi anāmaghi aha-ha, ma amazuru ayi; dika ndi nānwu anwu, ma le, ayi di ndu; dika ndi anēme ka ha muta ihe site n'ahuhu, ma adighi-eme ka ayi nwua;

10. dika ndi ihe nēwuta, ma ayi nāṅuri ọṅu mb͕e nile; dika ndi-ob͕eye, ma ayi nēme ka ọtutu madu buru ọgaranya; dika ndi nēnweghi ihe, ma ayi nēnwezu ihe nile.

11. Ndi Kọrint, ọnu-ayi ghere oghe igwawa unu okwu, emewo ka obi-ayi di obodobo.

12. Adighi-eme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà nime ayi, ma anēme ka unu nọ n'ọnọdu di oké nkpà n'obi nke unu.

13. Ma dika ugwọ-ọlu n'otù uzọ ahu (anamekwu dika anāgwa umum), ka eme kwa ka unu onwe-unu di obodobo n'obi-unu.

14. Unu na ndi nēkweghi ekwe ekekọtala onwe-unu, n'ihi na unu na ha di iche: n'ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ?

15. Ọzọ, òle nnwekọ-otù-olu Kraist na Belial nēnwekọ? ma-ọbu òle òkè onye kwere ekwe na onye nēkweghi ekwe nēkerita?

16. Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.

17. N'ihi nka Sinu n'etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Unu emetu-kwa-la ihe nādighi ọcha aka; Mu onwem gākpọbata kwa unu,

18. Buru kwa unu Nna, Unu onwe-unu gābu-kwa-ram umu-ndikom na umu-ndinyom, ka Onye-nwe-ayi kwuru, Nke puru ime ihe nile.

About II. Ndi Kọrint Chapter 6

Read II. Ndi Kọrint Chapter 6 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: II. Ndi Kọrint
Chapter: 6
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Ndi Kọrint. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading II. Ndi Kọrint Chapter 6 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is II. Ndi Kọrint Chapter 6?

II. Ndi Kọrint Chapter 6 is part of the Book of II. Ndi Kọrint in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete II. Ndi Kọrint Chapter 6 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 7

Explore More from ii-ndi-kọrint

  1. II. Ndi Kọrint Chapter 7
  2. II. Ndi Kọrint Chapter 12
  3. II. Ndi Kọrint Chapter 10
  4. II. Ndi Kọrint Chapter 5
  5. II. Ndi Kọrint Chapter 9
  6. II. Ndi Kọrint Chapter 4
  7. II. Ndi Kọrint Chapter 11

Related Chapters & Readings

  1. Joshua Chapter 12
  2. Zekaraia Chapter 6
  3. Job Chapter 28
  4. II. Ihe Emere Chapter 10
  5. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 11
  6. Ndi-Hibru Chapter 2
  7. II. Ihe Emere Chapter 35
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *