Read Mak Chapter 10 Online
Read Mak Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Mak and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Mak 10
Isi 10
1. O we si n'ebe ahu bilie, bia n'ókè-ala Judia, ya na ofè ọzọ nke Jọdan: ìgwè madu nile we zukọ ọzọ n'ebe Ọ nọ; ka O siri eme, O we nēzí ha ihe ọzọ.
2. Ndi-Farisi we biakute Ya, jua Ya, si, Ò ziri ezi n'iwu ka nwoke rapu nwunye-ya? nānwa Ya.
3. O we za, si ha, Gini ka Moses nyere unu n'iwu?
4. Ha we si, Moses kwere ka ede akwukwọ nkewa, ka arapu kwa ya.
5. Ma Jisus siri ha, N'ihi obi-etili-unu ka o dere unu iwu a n'akwukwọ.
6. Ma site na nmalite òkìkè uwa, Nwoke na nwanyi ka O mere ha.
7. N'ihi nka ka nwoke gēji rapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya;
8. ha abua ewe ghọ otù anu-aru: ya mere ha abughi kwa madu abua ọzọ, kama ọ bu otù anu-aru.
9. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, madu atọsala.
10. N'ulo ndi nēso uzọ-Ya we jua Ya ajuju okwu a ọzọ.
11. O we si ha, Onye ọ bula nke gārapu nwunye-ya, luru kwa nwunye ọzọ, ọ nākwa iko megide ya:
12. ọ buru kwa na nwanyi onwe-ya arapu di-ya, luru kwa di ọzọ, ọ nākwa iko.
13. Ha we kutara Ya umu-ntakiri, ka O we metu ha aka: ma ndi nēso uzọ-Ya bara ha nba.
14. Ma mb͕e Jisus huru ya, iwe were Ya nke-uku, Ọ si ha, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem; unu eb͕ochila ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.
15. N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli.
16. O we kuru ha n'aka-Ya, bikwasi ha aka-Ya abua, we gọzie ha nke-ọma.
17. Mb͕e ọ nāpu n'uzọ, otù onye we b͕akuru Ya, b͕uru Ya ikperè, jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi?
18. Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke.
19. I matawo ihe nile enyere n'iwu, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Emeb͕ula madu, Sọpuru nna-gi na nne-gi.
20. Ma ọ siri Ya, Onye-ozizí, ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia.
21. Ma mb͕e Jisus lere ya anya Ọ hu ya n'anya, si ya, Otù ihe fọduru gi ime: laba, re ka ihe i nwere ra, nye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.
22. Ma iru-ya b͕aruru n'okwu a, o we la na nwuta: n'ihi na ọ bu onye nwere ihe ri nne.
23. Jisus we le anya buruburu, si ndi nēso uzọ-Ya, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke!
24. Ma ibobo okwu-Ya nile nwuru ndi nēso uzọ-Ya n'aru. Ma Jisus za-kwa-ra ọzọ, si ha, Umum, le otú ọ diri ha ike ibà n'ala-eze Chineke, bú ndi wereworo obi-ha tukwasi n'àkù!
25. Ọ dikariri camel nfé igabiga n'anya àgìgá, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke.
26. Ma ibobo nwubigara ha ókè n'aru, ha sirita onwe-ha, Onye kwa ka apuru izọputa?
27. Jisus lere ha anya, si, N'ebe madu nọ ọ bu ihe anāpughi íme, ma ọ bughi n'ebe Chineke nọ n'ihi na apuru ime ihe nile n'ebe Chineke nọ.
28. Pita malitere isi Ya, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile, ayi esowo kwa Gi.
29. Jisus siri, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu umu-nne-ndikom, ma-ọbu umu-nne-ndinyom, ma-ọbu nne, ma-ọbu nna, ma-ọbu umu, ma-ọbu ubi, n'ihim, na n'ihi ozi ọma nkem,
30. ma-ọbughi na ọ gānata ọgu ise ọgu ise ub͕u a n'oge a, ulo, na umu-nne-ndikom, na umu-nne-ndinyom, na nne, na umu, na ubi, ha na nsob͕u; ọ gānata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia.
31. Ma ọtutu ndi bu uzọ gābu ndi-ikpe-azu; ndi-ikpe-azu gābu kwa ndi bu uzọ.
32. Ma ha nọ n'uzọ, nārigoro Jerusalem; Jisus we nāga n'iru ha: ibobo nwu-kwa-ra ha n'aru; ma ndi nēso Ya nātu egwu. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya ọzọ, malite igwa ha ihe nile gaje ime Ya,
33. si, Le, ayi nārigoro Jerusalem; agārara kwa Nwa nke madu nye n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ; ha gāma kwa Ya ikpe ọnwu, rara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ:
34. ha gēme kwa Ya ihe-ọchi, busa Ya ọnu-miri, pia Ya ihe, b͕ue Ya: Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.
35. Jemes na Jọn, bú umu Zebedi, we biakute Ya, si Ya, Onye-ozizí, ayi nāchọ ka I mere ayi ihe ọ bula ayi gāriọ Gi.
36. O we si ha, Gini ka unu nāchọ ka M'mere unu?
37. Ha we si Ya, Me ayi ka ayi nọdu, otù n'aka-nri-Gi, otù n'aka-ekpe, n'ebube-Gi.
38. Ma Jisus siri ha, Unu amataghi ihe unu nāriọ. Ùnu puru iṅu iko ahu nke Mu onwem nāṅu? ma-ọbu ka eme unu baptism ahu dika anēme Mu onwem?
39. Ha we si Ya, Ayi puru. Jisus we si ha, Iko Mu onwem nāṅu ka unu gaṅu; baptism nke anēme Mu onwem ka agēme kwa unu:
40. ma inọdu n'aka-nrim ma-ọbu n'aka-ekpem abughi nkem inye: kama ọ diri ndi edoziworo ya.
41. Mb͕e ndi-ozi iri fọduru nuru ya iwe we malite iwe ha nke-uku n'ihi Jemes na Jọn.
42. Jisus we kpọ ha biakute Ya, si ha, Unu amatawo na ndi aguru ibu ndi-isi nke mba nile ọzọ nēme ha dika ndi nwe ha; ndi uku ha nāchi kwa ha.
43. Ma ọ dighi otú a n'etiti unu: kama onye ọ bula nke nāchọ ka eme ya onye uku n'etiti unu, ọ gābu onye nējere unu ozi:
44. ọzọ, onye ọ bula nke nāchọ ka ọ buru onye-isi n'etiti unu, ọ gabu orù unu nile.
45. N'ihi na Nwa nke madu Onwe-ya abiaghi ka ejere Ya ozi, kama ka O je ozi, ka O were kwa ndu-Ya nye ka ọ buru ihe-nb͕aputa n'ọnọdu ọtutu madu.
46. Ha we bia rue Jeriko: mb͕e Ọ nāputa na Jeriko, Ya na ndi nēso uzọ-Ya na oké ìgwè madu, nwa-nwoke Timiọs, bú Bātimiọs, onye-aririọ kpuru ìsì, nānọdu n'akuku uzọ.
47. Mb͕e ọ nuru na ọ bu Jisus Onye Nazaret, o we malite íti nkpu, na isi, Nwa Devid, Jisus, merem ebere.
48. Ọtutu madu we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma o tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere.
49. Jisus we guzo, si, Kpọnu ya. Ha we kpọ onye-ìsì ahu, si ya, Nwe obi ike: bilie, Ọ nākpọ gi.
50. O we chifu uwe-ya, zọlie, biakute Jisus.
51. Jisus we za ya, si, Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Onye-ìsì ahu we si ya, Rabonai, ka eme ka m'hu uzọ.
52. Jisus we si ya, Laba; okwukwe-gi azọputawo gi. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya n'uzọ.
About Mak Chapter 10
Read Mak Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Mak
Chapter: 10
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Mak. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Mak Chapter 10 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Mak Chapter 10?
Mak Chapter 10 is part of the Book of Mak in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Mak Chapter 10 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6