Mak Chapter 8

For English

Read Mak Chapter 8 Online

Read Mak Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Mak and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Mak 8

Isi 8

1. Na mb͕e ahu, mb͕e oké ìgwè madu di kwa ọzọ, mb͕e ha nēnweghi kwa ihe ha gēri, Ọ kpọrọ ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, si ha,

2. Enwerem ọmiko n'aru ìgwè madu a, n'ihi na Mu na ha nọgidere ubọchi atọ ub͕u a, ha enweghi kwa ihe ha gēri:

3. ọ buru kwa na ezilagam ha n'ulo-ha n'ọnu efu, ha gāda #mbà n'uzọ; ufọdu nime ha si kwa n'ebe di anya bia.

4. Ndi nēso uzọ-Ya we za Ya, si, Ọle ebe ka madu gēsi pu inwe ob͕e achicha inyeju ndia afọ nime ọhia ebe a?

5. O we jua ha, si, Ùnu nwere ob͕e achicha ole? Ha we si, Asa.

6. O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala: O we nara ob͕e achicha asa ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ka ha debe n'iru ha; ha we debe ha n'iru ìgwè madu ahu.

7. Ha nwe-kwa-ra azù ntà ole-na-ole: O we gọzie ha, si ka edebe kwa ndia n'iru ha.

8. Ha we rie, afọ ju kwa ha: ha we tutukọ iberibe fọduru, abọ asa.

9. Ma ndi ahu ra ka nnù iri: O we zilaga ha.

10. Ngwa ngwa Ya na ndi nēso uzọ-Ya we ba n'ub͕ọ-ha, bia n'akuku Dalmanuta.

11. Ndi-Farisi we puta, malite iju Ya ajuju, nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'inwa Ya.

12. O we sua udè nke-uku na mọ-Ya, si, Gini mere ọb͕ọ a nāchọ ihe-iriba-ama? n'ezie asim unu, Agaghi-enye ọb͕ọ a ihe-iriba-ama.

13. O we rapu ha, ba kwa n'ub͕ọ ọzọ, we gabiga n'ofè ọzọ.

14. Ha we chezọ iwere ob͕e achicha; ha enweghi kwa n'aka-ha nime ub͕ọ ihe kariri otù ob͕e achicha.

15. O we gwasie ha ike, si, Nēlenu anya, lezienu anya ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, na ihe Herod, bú ihe nēko achicha.

16. Ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ bu n'ihi na ayi enweghi ob͕e achicha.

17. Ebe Jisus mara ya Ọ si ha, Gini mere unu nēkwurita n'onwe-unu, n'ihi na unu enweghi ob͕e achicha? ùnu akātugharighi uche, ùnu akāghọtaghi kwa? èmere obi-unu etili?

18. Unu ahughi uzọ mb͕e unu nwere anya? ùnu anughi kwa ihe mb͕e unu nwere nti? ùnu echetaghi kwa?

19. Mb͕e M'nyawara ob͕e achicha ise nye nnù madu iri na nnù abua na ọgu iri, ǹkata ole juputara n'iberibe ka unu bulitere? Ha si Ya, Iri na abua.

20. Mb͕e M'nyawara asa nye nnù madu iri, ìberibe juputara abọ ole ka unu tutukọrọ? Ha we si Ya, Asa.

21. O we si ha, Ùnu akāghọtaghi?

22. Ha we bía na Betsaida. Ha we kutara Ya onye-ìsì, riọ Ya ka O metu ya aka.

23. O we jide onye-ìsì ahu n'aka, duputa ya n'obodo ntà ahu; mb͕e Ọ busara ya ọnu-miri n'anya, bikwasi kwa ya aka-Ya abua, O we jua ya, si, Ọ̀ di ihe i huru?

24. O we le anya n'elu, si, Ahurum madu; n'ihi na ahurum ha dika osisi, ha nējeghari.

25. Mb͕e ahu O bikwasiri aka-Ya abua n'anya-ya ọzọ; o we legide anya, eme kwa ka anya-ya di ka ha di na mbu, o we hucha ihe nile.

26. O we zilaga ya n'ulo-ya, si, Abàla ọbuná n'obodo ntà nke à.

27. Jisus we pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, ba n'obodo ntà nile nke Sisaria Filipi: mb͕e ha nọ n'uzọ O we jua ndi nēso uzọ-Ya, si ha, Onye ka madu nāsi na Mu onwem bu?

28. Ha we gwa Ya, si, Jọn Baptist: ndi ọzọ si kwa, Elaija; ma ndi ọzọ si, Otù nime ndi-amuma.

29. Ya onwe-ya we jua ha, si, Ma ọ̀ bu onye ka unu onwe-unu si na Mu bu? Pita we za, si Ya, Gi onwe-gi bu Kraist ahu.

30. O we dọ ha aka na nti ka ha ghara igwa onye ọ bula okwu bayere Ya.

31. O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.

32. Ọ nēkwuwa kwa, okwu ahu. Pita we kuru Ya nye n'aru, malite ibara Ya nba.

33. Ma mb͕e O chighariri, hu ndi neso uzọ-Ya, Ọ bara Pita nba si, Ga n'azum, Setan: n'ihi na i dighi-atukwasi uche-gi n'ihe Chineke, kama ọ bu n'ihe madu.

34. O we kpọ ìgwè madu ahu, ha na ndi nēso uzọ-Ya, ka ha biakute Ya, Ọ si ha, Ọ buru na onye ọ bula achọ ka o som n'azu, ya ju onwe-ya, buli kwa obe-ya, nēsokwam.

35. N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim na n'ihi ozi ọma nkem, ọ gāzọputa ya.

36. N'ihi na ùrù gini ka ọ bara madu, irita elu-uwa dum n'urù, ewe napu ya ndu-ya?

37. N'ihi na ìhe-nb͕anwe gini ka madu gēji b͕anwe ndu-ya?

38. N'ihi na onye ọ bula ihere Mu onwem na okwum nile gēme n'ọb͕ọ a nke nākwa iko, nke nēmehie kwa, ihere onye ahu gēme kwa Nwa nke madu, mb͕e Ọ gābia n'ebube nke Nna-Ya, Ya na ndi mọ-ozi-Ya di nsọ.

About Mak Chapter 8

Read Mak Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Mak in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Mak
Chapter: 8
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Mak. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Mak Chapter 8 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Mak Chapter 8?

Mak Chapter 8 is part of the Book of Mak in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Mak Chapter 8 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from mak

  1. Mak Chapter 12
  2. Mak Chapter 2
  3. Mak Chapter 9
  4. Mak Chapter 11
  5. Mak Chapter 13
  6. Mak Chapter 15
  7. Mak Chapter 6

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 3
  2. I. Samuel Chapter 30
  3. Daniel Chapter 8
  4. Daniel Chapter 9
  5. II. Samuel Chapter 16
  6. Deuteronomi Chapter 29
  7. II. Samuel Chapter 20
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *