Luk Chapter 4

For English

Read Luk Chapter 4 Online

Read Luk Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Luk in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Luk and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Luk 4

Isi 4

1. Ma ebe Jisus juputara na Mọ Nsọ, O si na Jọdan laghachi, Mọ ahu we duru Ya nāgaghari n'ọhia,

2. ekwensu nānwà kwa Ya ọgu ubọchi abua. O righi kwa ihe ọ bula n'ubọchi ahu: mb͕e ubọchi ahu zuru, agu we gua Ya.

3. Ekwensu we si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, gwa nkume a ka ọ ghọ ob͕e achicha.

4. Jisus we za ya, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu.

5. Ọ we duru Ya rigo, we gosi Ya ala-eze nile nke elu-uwa dum madu bi na nkenke oge.

6. Ekwensu we si Ya, Gi ka m'gēnye ike a nile, na ebube-ha: n'ihi na ararawo ya nye n'akam; onye ọ bula m'chọ-kwa-ra inye ya m'nye ya.

7. Ya mere ọ buru na Gi onwe-gi gākpọ isi ala n'irum, ihe a nile gābu nke Gi.

8. Jisus we za, si ya, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye-nwe-ayi Chineke-gi ka i gākpọ isi ala nye, ọ bu kwa nání Ya ka i gēkpere.

9. O we duru Ya ga Jerusalem, guzo Ya n'elu akuku ulo uku Chineke, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, si n'ebe a tuda Onwe-gi n'ala:

10. n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi-mọ-ozi-Ya ka Ọ gēnye iwu bayere gi:

11. Ọzọ, Ọ bu kwa n'elu aka-ha ka ha gēburu gi, Ka i ghara ikpọbì ukwu-gi na nkume ma eleghi anya.

12. Jisus we za, si ya, Ekwuwo, si, Anwala Onye-nwe-ayi Chineke-gi.

13. Mb͕e ekwensu nwasiri ọnwunwa nile, o we si n'ebe Ọ nọ pua rue mb͕e ọzọ.

14. Jisus we laghachi na Galili n'ike Mọ Nsọ: ùdé-Ya we pua jesa n'ala dum di buruburu.

15. Ya onwe-ya we nēzí ihe n'ulo-nzukọ nile ha, madu nile nēnye kwa Ya otuto.

16. O we bia rue Nazaret, ebe azuputara Ya, O we ba n'ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike, dika Ọ nēme mb͕e dum, O we bilie igu akwukwọ.

17. Ewe nye Ya akwukwọ Aisaia onye-amuma n'aka. Ó we meghe akwukwọ ahu, chọta ebe edeworo ya, si,

18. Mọ nke Onye-nwe-ayi di n'arum. N'ihi na O terem manu izì ndi-ob͕enye ozi ọma: O ziteworom ikwusa ọrira gwa ndi adọtara n'agha, Na ikwusa ihu-uzọ gwa ndi-ìsi, Izipu ndi etihiawara aru ka ha la,

19. Ikwusa arọ mb͕e Onye-nwe-ayi nānara madu nke-ọma.

20. O we kpuchie akwukwọ ahu, were ya nyeghachi onye nējere ha ozi, we nọdu ala: ndi nile nọ n'ulo-nzukọ ahu we nēlegide Ya anya.

21. O we malite isi ha, Ta ka emezuworo ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ na nti-unu.

22. Ha nile we buru ndi-àmà-Ya, okwu nile nke amara nke si n'ọnu-Ya puta nēju kwa ha nile anya: ha we si, Onye a, Ọ̀ bughi Nwa Josef?

23. O we si ha, N'ezie unu gaturu m ilu a, Dibia, me ka aru Gi onwe-gi di ike: ka ihe ayi nuru na emere ha na Kapanaum ra, me kwa otú a n'ebe a n'obodo nke aka Gi.

24. O we si, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye-amuma ọ bula nke anara nke-ọma n'obodo nke aka ya.

25. Ma n'ezie ka M'nāsi unu, Ọtutu ndinyom di-ha nwuru di n'ala Israel n'ubọchi Elaija, mb͕e emechiri elu-igwe arọ atọ na ọnwa isi, mb͕e oké unwu dara n'ala ahu nile;

26. ma ọ dighi onye ọ bula nime ha ezigara Elaija, kama nání Zarefat, n'ala Saidon, jekuru nwanyi di-ya nwuru.

27. Ọtutu ndi-ekpenta di kwa n'Israel na mb͕e Elaisha onye-amuma; ma ọ dighi onye ọ bula nime ha emere ka ọ di ọcha, kama nání Neamam onye Siria.

28. Ọnuma we juputa ha nile n'ulo-nzukọ ahu, mb͕e ha nuru okwu ndia;

29. ha we bilie, chupu Ya n'obodo ahu, duru Ya ga rue mpempe ugwu nke ewuru obodo-ha n'elu ya, ka ha we kwada Ya n'ala.

30. Ma Ya onwe-ya gabigara n'etiti ha la.

31. O we ridata na Kapanaum, otù obodo nke Galili, O we nēzi ha ihe n'ubọchi-izu-ike:

32. ibobo ozizí-Ya we nwua ha n'aru; n'ihi na okwu-Ya di ike.

33. Otù nwoke nọ kwa n'ulo-nzukọ-ha, nke nwere mọ ọjọọ; o we were oké olu tisie nkpu ike, si,

34. pua ebe a! ginl ka ayi na Gi nwekọrọ, Jisus Onye Nazaret? Ì biara ila ayi n'iyì? amataram, Onye I bu, Onye Nsọ ahu nke Chineke.

35. Jisus we bara ya nba, si, Kpuchie ọnu-gi, si kwa nime ya puta. Mb͕e mọ ọjọ ahu tudasiri ya n'ala n'etiti ha, o we si nime ya puta, nēmerughi ya aru.

36. Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Gini bu okwu a? n'ihi na O ji ichi-isi na ike nye ndi-mọ nādighi ọcha iwu, ha we puta.

37. Ùzù-Ya we tua gazue n'ebe nile nke ala di obodo ahu gburugburu.

38. O we si n'ulo-nzukọ ahu bilie, ba n'ulo Saimon. Ma oké aru-ọku jisiri nne nwunye Saimon ike; ha we kpe ekpere banyere ya.

39. O we guzo n'akuku ya, bara aru-ọku ahu nba; aru-ọku ahu we rapu ya: ngwa ngwa o we bilie nēje-kwa-ra ha ozi.

40. Ma mb͕e anyanwu nāda, ndi nile, ka ha ra, bú ndi nwere madu aru nādighi nma n'ọria di iche iche, kuru ha biakute Ya; O we bikwasi ha nile n'otù n'otù aka-Ya abua, me kwa ka aru di ha ike.

41. Ndi-mọ ọjọ puta-kwa-ra n'ọtutu madu, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke. Ma Ọ nābara ha nba, O kweghi kwa ka ha kwue okwu, n'ihi na ha matara na Ya bu Kraist.

42. Ma mb͕e chi bọrọ, Ọ pua ga n'ebe bu ọhia: igwè madu nile we nāchọ Ya, we biakute Ya, malite kwa ib͕ochi Ya, ka Ọ ghara isi na nke ha ga ebe ọzọ.

43. Ma Ọ siri ha, Aghaghm izì kwa obodo nile ọzọ ozi ọma ala-eze Chineke: n'ihi na eziterem ime nka.

44. O nēkwusa kwa okwu Chineke n'ulo-nzukọ nile nke Galili.

About Luk Chapter 4

Read Luk Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Luk in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Luk
Chapter: 4
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Luk. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Luk Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Luk Chapter 4?

Luk Chapter 4 is part of the Book of Luk in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Luk Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 1
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from luk

  1. Luk Chapter 18
  2. Luk Chapter 3
  3. Luk Chapter 14
  4. Luk Chapter 7
  5. Luk Chapter 15
  6. Luk Chapter 13
  7. Luk Chapter 24

Related Chapters & Readings

  1. Ilu Chapter 9
  2. Ilu Chapter 2
  3. Ezikiel Chapter 31
  4. Ndi-Hibru Chapter 13
  5. Ezikiel Chapter 45
  6. Abù Ọma Chapter 123
  7. Ọpupu Chapter 37
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *