Ndi Rom Chapter 3

For English

Read Ndi Rom Chapter 3 Online

Read Ndi Rom Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi Rom in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi Rom and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ndi Rom 3

Isi 3

1. Gini kwa ka onye-Ju nwebigara ókè? ma-ọbu ùrù gini ka ibì-úgwù bara?

2. Ọ bara urù ri nne n'uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n'ọnu Chineke puta nye ha n'aka na ntukwasi-obi.

3. N'ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè?

4. Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n'otù n'otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka ewe gua Gi n'onye ezi omume n'okwu-Gi nile, Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé.

5. Ma ọ buru na ajọ omume-ayi eme ka ezi omume Chineke puta ìhè, gini ka ayi gēkwu? Chineke, Onye nēme ka iwe-Ya dakwasi ayi, Ọ̀ bu onye ajọ omume? (Anamekwu dika madu.)

6. Chineke ekwela: n'ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé?

7. Ma ọ buru na ezi-okwu nke Chineke babigara uba ókè n'iwetara Ya ebube site n'okwu-ugha nkem, gini mere anēkpe kwa mu onwem ikpé ọzọ dika onye-nmehie?

8. gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi.

9. Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n'ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n'okpuru nmehie;

10. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli;

11. Ọ dighi onye nāghọta, Ọ dighi onye nāchọ Chineke;

12. Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù; Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye:

13. Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ: Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha:

14. Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu:

15. Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;

16. Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha;

17. Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa:

18. Egwù Chineke adighi n'anya-ha.

19. Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ:

20. n'ihi na site n'ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n'onye ezi omume n'iru Ya: n'ihi na ọ bu n'aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere.

21. Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n'ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà;

22. ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche;

23. n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;

24. anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n'onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus:

25. Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke;

26. ka O we gosi ezi omume-Ya n'oge di ub͕u a, ka m'kwuru: ka Ya onwe-ya we buru onye ezi omume, buru kwa onye nāgu onye ahu n'onye ezi omume, bú onye nọ n'okwukwe ekwere na Jisus.

27. Òle ebe inya-isi-ayi di kwa? Emechibidowo ya n'èzi. Sìte n'aha iwu gini? ọ̀ bu nke ọlu? É-è: kama ọ bu site n'iwu nke okwukwe.

28. Ya mere ayi guru na anāgu madu n'onye ezi omume site n'okwukwe, mb͕e ọ kālughi ọlu iwu.

29. Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ bu Chineke nke nání ndi-Ju? Ọ̀ bughi kwa Chineke nke ndi mba ọzọ? E, ọ bu kwa nke ndi mba ọzọ:

30. asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n'okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume.

31. Àyi nēsite kwa n'okwukwe-ayi me ka iwu ghara idi irè? Chineke ekwela: kama ayi nēme ka iwu guzo.

About Ndi Rom Chapter 3

Read Ndi Rom Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi Rom in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ndi Rom
Chapter: 3
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi Rom. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ndi Rom Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ndi Rom Chapter 3?

Ndi Rom Chapter 3 is part of the Book of Ndi Rom in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ndi Rom Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 7

Explore More from ndi-rom

  1. Ndi Rom Chapter 12
  2. Ndi Rom Chapter 6
  3. Ndi Rom Chapter 14
  4. Ndi Rom Chapter 2
  5. Ndi Rom Chapter 1
  6. Ndi Rom Chapter 11
  7. Ndi Rom Chapter 5

Related Chapters & Readings

  1. I. Jọn Chapter 1
  2. Jenesis Chapter 21
  3. Eklisiastis Chapter 6
  4. Jemes Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 14
  6. Abù Nke Abù Chapter 1
  7. Daniel Chapter 9
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *