Ndi Rom Chapter 9

For English

Read Ndi Rom Chapter 9 Online

Read Ndi Rom Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi Rom in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi Rom and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ndi Rom 9

Isi 9

1. Anamekwu ezi-okwu nime Kraist, ekwughi m okwu-ugha, akọ-na-uchem nēsokwam b͕a àmà nime Mọ Nsọ,

2. na enwerem oké ihe-nwuta na ihe-nb͕u nādighi-agwu n'obim.

3. N'ihi na anamekperi ekpere, ka mu onwem buru anathema pua n'ebe Kraist nọ n'ihi umu-nnem, ndi-ikwum dika anu-aru si di:

4. ebe ha bu ndi Israel; ndi nwe ido-ka-nwa-nwoke ahu, na ebube ahu, na ọb͕ub͕a-ndu nile, na inye-iwu ahu, na ikpe ekpere ahu n'ulo uku Chineke, na nkwa nile;

5. ndi nwe nna-ayi-hà, ndi Kraist-ayi si kwa n'etiti ha puta dika anu-aru si di, Onye bu Onye-isi ihe nile, bu kwa Chineke, Nke agọziworo rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

6. Ma ọ bughi dika agāsi na okwu Chineke adawo n'ala. N'ihi na ndi si n'Israel puta, ọ bughi ndi ahu nile bu Israel:

7. ọ bughi kwa ha nile bu umu, n'ihi na ha bu nkpuru Abraham: kama, Nime Aisak ka agākpọ nkpuru-gi aha.

8. Nke ahu bu, umu nke anu-aru-ya, ọ bughi ndia bu umu Chineke; kama umu nke nkwa ahu ka anāgu na nkpuru.

9. N'ihi na nka bu okwu nke nkwa, Dika oge a si di M'gābia, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.

10. Ma ọ bughi nání nka; kama Rebeka kwa, mb͕e ọ tusiri ime site n'otù onye, bú Aisak nna-ayi-

11. n'ihi na mb͕e akāmughi umu ahu, mb͕e ha akēmeghi kwa ihe ọ bula, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma, ka ihe Chineke zubere dika nrọputa si di we digide, o siteghi n'ọlu, kama o sitere n'Onye nākpọ,

12. asiri ya, Nke-okenye gēfè nke-ntà.

13. Dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Jekob ka M'huru n'anya, ma Isọ ka M'kpọrọ asì.

14. Gini ka ayi gēkwu kwa? Ọ̀ gābu na ajọ omume di n'ebe Chineke nọ? Chineke ekwela.

15. N'ihi na Ọ si Moses, M'gēmere onye ọ bula ebere, bú onye M'nēmere ebere, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ọ bula, bú onye M'gēnwe obi-ebere n'aru-ya.

16. Ya mere otú a ọ bughi nke onye nāchọ, ọ bughi kwa nke onye nāb͕a ọsọ, kama ọ bu nke Onye ahu Nke nēme ebere, bú Chineke.

17. N'ihi na ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nāsi Fero, Ọ bu n'ihi otù ihe a ka M'mere ka i bilie, ka M'we gosi ikem nime gi, ka ewe kwusa kwa aham n'uwa nile.

18. Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.

19. Ya mere i gāsim, Gini mere Ọ nọ nāta uta? N'ihi na ọ̀ bu onye nēguzogide ihe O zubere?

20. Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a?

21. Ma-ọbu ọkpu-ite, ò nweghi ike n'ebe urọ di, isite n'otù ọkpukpu-urọ ahu o doziri me nka ka ọ buru ihe gānara nsọpuru, me kwa nke-ọzọ ka ọ buru ihe agēme ihe-ihere?

22. Gini kwa, ma ọ buru na Chineke, ọ bu ezie na Ọ nāchọ igosi iwe-Ya, na ime ka amara ike-Ya, ma O were ogologo-ntachi-obi ri nne nagide ihe iwe edoziworo ka ha bà n'ila-n'iyì:

23. ka O we me kwa ka amara àkù nke ebube-Ya n'aru ihe diri ebere, nke O buru uzọ dozie ka ha ba n'ebube,

24. bú ayi onwe-ayi, ndi Ọ kpọ-kwa-ra, ọ bughi site na nání ndi-Ju, kama site kwa na ndi mba ọzọ?

25. Dika O nēkwu kwa n'akwukwọ Hosea, si, M'gākpọ ndi ahu ndim, nke nābughi ndim; M'gākpọ kwa nwanyi ahu onye ahuru n'anya, nke anāhughi n'anya.

26. O gēru kwa, na n'ebe ahu nke asiri ha, Ọ bughi ndim ka unu bu, N'ebe ahu ka agākpọ ha umu-ndikom nke Chineke di ndu.

27. Ma Aisaia nēti nkpu bayere Israel, si, Ọ buru na ọnu-ọgugu umu Israel di ka ájá nke oké osimiri, ọ bu nke fọduru ka agāzọputa:

28. n'ihí na Onye-nwe-ayi gēme ihe O kwuru n'elu uwa, nēmezu ya nēme kwa ya ka o bìe.

29. Ọzọ, dika Aisaia buru uzọ kwue, Ọ buru na Onye-nwe usu nile nke ndi-agha arapughi ayi otù nkpuru, Ayi gādiwori ka Sọdọm, agēmewori ayi ka ayi yie Gọmọra.

30. Gini ka ayi gēkwu kwa? Na ndi mba ọzọ, ọ bu ezie na ha ab͕asoghi ezi omume, ma ha ruru ezi omume, ma ọ bu ezi omume ahu nke si n'okwukwe puta:

31. ma Israel, ọ bu ezie na ha nāb͕aso iwu ezi omume, ma ha ekwudoghi iwu ahu.

32. N'ìhi gini? N'ihi na ha esiteghi n'okwukwe chọ ya, kama dika agāsi na ha sitere n'ọlu chọ ya. Ha suru ngọngọ na nkume nke isu-ngọngọ-ha;

33. dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, anamatọb͕ọ nime Zaion nkume nke isu-ngọngọ, na oké nkume nke ima-n'ọnyà: Onye kwe-kwa-ra na Ya, agaghi-eme ka ihere me ya n'iru.

About Ndi Rom Chapter 9

Read Ndi Rom Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi Rom in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ndi Rom
Chapter: 9
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi Rom. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ndi Rom Chapter 9 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ndi Rom Chapter 9?

Ndi Rom Chapter 9 is part of the Book of Ndi Rom in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ndi Rom Chapter 9 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 7

Explore More from ndi-rom

  1. Ndi Rom Chapter 6
  2. Ndi Rom Chapter 7
  3. Ndi Rom Chapter 8
  4. Ndi Rom Chapter 11
  5. Ndi Rom Chapter 4
  6. Ndi Rom Chapter 12
  7. Ndi Rom Chapter 10

Related Chapters & Readings

  1. Aisaia Chapter 51
  2. I. Ndi-Eze Chapter 10
  3. I. Samuel Chapter 18
  4. I. Ndi Kọrint Chapter 2
  5. Job Chapter 4
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 27
  7. Deuteronomi Chapter 34
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *