Read Ndi Rom Chapter 14 Online
Read Ndi Rom Chapter 14 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi Rom in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi Rom and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Ndi Rom 14
Isi 14
1. Ma kpọbatanu onye nādighi ike n'okwukwe-ya, ọ bughi ikpa ókè n'ihe ọ nātule n'obi.
2. Otù onye nwere okwukwe iri ihe nile: ma onye nādighi ike nēri nání ihe anāku n'ubi.
3. Ka onye nēri ihe ghara ikpọ onye nādighi-eri ihe-efu; ka onye nādighi-eri ghara kwa ikpe onye nēri ikpé: n'ihi na Chineke kpọbatara ya.
4. Gi onwe-gi nke nēkpe onye nējere onye ọzọ ozi, i bu onye? ọ bu n'ebe Onye-nwe ya onwe-ya nọ ka ọ nēguzo ma-ọbu nāda. Ma agēme ya ka o guzo; n'ihi na Onye-nwe-ayi puru ime ya ka o guzo.
5. Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya.
6. Onye nātukwasi uche n'ubọchi, nātukwasi uche na ya n'ebe Onye-nwe-ayi nọ: onye nēri kwa, nēri n'ebe Onye-nwe-ayi nọ, n'ihi na ọ nēkele Chineke; onye nādighi-eri kwa, n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ọ nādighi-eri, ọ nēkele kwa Chineke.
7. N'ihi na ọ dighi onye ọ bula n'etiti ayi nke di ndu n'ebe ya onwe-ya nọ, ọ dighi kwa onye ọ bula nwuru anwu n'ebe ya onwe-ya nọ.
8. N'ihi na asi na ayi di ndu, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi di ndu; ma asi na ayi nwuru, ọ bu n'ebe Onye-nwe-ayi nọ ka ayi nwuru: ya mere, ma ayi di ndu, ma ayi nwuru anwu, ayi bu ndi nke Onye-nwe-ayi.
9. N'ihi na ihe Kraist ji nwua, di kwa ndu ọzọ, bu nka, ka O we buru Onye-nwe ma ndi nwuru anwu ma ndi di ndu.
10. Ma gi onwe-gi, gini mere i nēkpe nwa-nna-gi ikpé? ma-ọbu gi onwe-gi kwa, gini mere i nākpọ, nwa-nna-gi ihe-efu? n'ihi na ayi nile gēguzo n'iru oche-ikpé Chineke.
11. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Dika Mu onwem nādi ndu, ka Onye-nwe-ayi kwuru, ọ bu Mu onwem ka ikperè nile ọ bula gēb͕uru, Ire nile ọ bula gēkwuputa kwa Chineke.
12. Ya mere otú a onye ọ bula n'etiti ayi gāza ajuju bayere onwe-ya nye Chineke.
13. Ya mere ka ayi ghara ikperita ibe-ayi ikpé ọzọ: ma kama ya kpenu ikpé a, ka onye ọ bula ghara idebe ihe-isu-ngọngọ, ma-ọbu ọnyà, n'uzọ nwa-nna-ya.
14. Amataram, eme-kwa-ra ka m'kweye nime Onye-nwe-ayi Jisus, na ọ dighi ihe ruru árú site n'onwe-ya: ọ bu nání n'ebe ọ nọ, bú onye nāgu ihe ọ bula na ọ ruru árú, n'ebe onye ahu nọ ka ọ ruru árú.
15. N'ihi na asi na n'ihi ihe-oriri ọ nēwuta nwa-nna-gi, i dighi-ejeghari ọzọ dika ihu-n'anya si di. Ewela ihe-oriri-gi la onye ahu n'iyì, bú onye Kraist nwuru n'ihi ya.
16. Ya mere unu ekwela ka ekwulu ezi ihe-unu:
17. n'ihi na ala-eze Chineke abughi oriri na ọṅuṅu, kama ọ bu ezi omume na udo na ọṅù nime Mọ Nsọ.
18. N'ihi na onye nābu orù Kraist n'uzọ nka, ọ di Chineke ezi utọ, buru kwa onye anwaputara n'iru madu.
19. Ya mere otú a, ka ayi nāb͕aso ihe nile diri udo, na ihe nile diri iwulirita onwe-ayi elu dika ulo.
20. Akwatula ọlu Chineke n'ihi ihe-oriri. Ihe nile di ọcha n'ezie; ma ihe ọ bula buru madu ahu ihe ọjọ, onye were ihe-isu-ngọngọ nēri ya.
21. Ọ di nma ka i ghara iri anu, ma-ọbu iṅu manya-vine, ma-ọbu ime ihe ọ bula nke nwa-nna-gi gāsu ngọngọ nime ya.
22. Okwukwe ahu nke gi onwe-gi nwere, nwe ya n'onwe-gi n'iru Chineke. Ngọzi diri onye nēkpeghi onwe-ya ikpé n'ihe ọ nānwaputa.
23. Ma onye nwere obi abua, amawo ya ikpé ma o rie, n'ihi na o siteghi n'okwukwe rie; ma ihe ọ bula nke nēsiteghi n'okwukwe bu nmehie.
About Ndi Rom Chapter 14
Read Ndi Rom Chapter 14 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi Rom in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Ndi Rom
Chapter: 14
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi Rom. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Ndi Rom Chapter 14 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Ndi Rom Chapter 14?
Ndi Rom Chapter 14 is part of the Book of Ndi Rom in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Ndi Rom Chapter 14 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6
Explore More from ndi-rom
- Ndi Rom Chapter 3
- Ndi Rom Chapter 4
- Ndi Rom Chapter 10
- Ndi Rom Chapter 7
- Ndi Rom Chapter 2
- Ndi Rom Chapter 12
- Ndi Rom Chapter 6