Read Luk Chapter 16 Online
Read Luk Chapter 16 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Luk in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Luk and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Luk 16
Isi 16
1. O we si kwa ndi nēso uzọ-Ya, Otù ọgaranya di, nke nwere onye nāchi èzí-na-ulo-ya; onye a ka eboro n'iru ya na ọ nēmefu ihe o nwere.
2. Ọ we kpọ ya, si ya, Ọ̀ bu gini bu nka nke m'nānu bayere gi? kọrọm akukọ nke ọchichi-èzí-na-ulo-gi; n'ihi na i pughi ichi èzí-na-ulo ọzọ.
3. Onye ahu nke nāchi èzí-na-ulo we kwue n'onwe-ya, si, Gini ka m'gēme, n'ihi na onye-nwem nānapum ọchichi-èzí-na-ulo a? Enweghi m ike igwu ala; ihere iriọ aririọ nēmem.
4. Amaram ihe m'gēme, ka, mb͕e ọ bula agēwepum n'ọchichi-èzí-na-ulo a, ka ha we kpọbatam n'ulo nke aka ha.
5. O we kpọ ndi nile ji onye-nwe-ya ugwọ n'otù n'otù, si onye mbu, Ùgwọ ole ka i ji onye-nwem?
6. Ọ si, Ọgu mb͕é manu ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, nọdu ọsọsọ, de ọgu abua na iri.
7. Mb͕e ahu ọ siri onye ọzọ, Ùgwọ ole ka gi onwe-gi ji kwa? Ọ si, Ọgu mb͕é ọka ise. Ọ si ya, Were akwukwọ-gi, de ọgu anọ.
8. Onye-nwe-ya we to onye ahu nāchi èzí-na-ulo nke nēme ajọ omume, n'ihi na o mere dika onye nwere uche: n'ihi na umu nke oge a nwere uche n'ebe ọb͕ọ nke aka ha nọ kari umu nke ìhè.
9. Mu onwem nāsi kwa unu, Menu ndi-eyi nye onwe-unu site n'àkù nke ajọ omume; ka, mb͕e ọ bula ọ gāgwu, ka ha we kpọbata unu n'ulo-ikwū ebighi-ebi.
10. Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n'ihe dikarisiri ntà kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n'oké ihe: onye bu kwa onye ajọ omume n'ihe dikarisiri ntà bu kwa onye ajọ omume n'oké ihe.
11. Ya mere, ọ buru na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'àkù ajọ omume, ònye gēnye ezi àkù n'aka-unu na ntukwasi-obi idebe?
12. Ọ buru kwa na unu abughi ndi kwesiri ka atukwasi unu obi n'ihe onye ọzọ nwere, ònye gēnye unu ihe nke aka unu?
13. Ọ dighi onye ọ bula nke nēje ozi nke puru ibu orù nke nna abua: n'ihi na ọ gākpọ otù onye nime ha asì, hu ibe-ya n'anyá; ma ọ bughi otú a ọ gējide otù, lelìa ibe-ya anya. Unu apughi ibu orù Chineke na àkù.
14. Ma ndi-Farisi, ndi nāhu ego n'anya, nuru ihe ndia nile: ha we me Ya ihe-ọchì.
15. O we si ha, Unu onwe-unu bu ndi nāgu onwe-unu na ndi ezi omume n'anya madu; ma Chineke mara obi-unu: n'ihi na ihe di elu n'etiti madu bu ihe-árú n'anya Chineke.
16. Iwu Chineke na ndi-amuma-Ya di rue oge Jọn: site n'oge ahu anēzisa ozi ọma ala-eze Chineke, madu nile n'otù n'otù were ihe-ike nābà nime ya.
17. Ma ọ ka nfé ka elu-igwe na ala gabiga, kari na otù ihe dikarisiri ntà n'iwu ahu gāda.
18. Nwoke ọ bula nke nārapu nwunye-ya, nke luru kwa nwanyi ọzọ, ọ nākwa iko: onye nālu nwanyi nke di-ya rapuworo nākwa kwa iko.
19. Ma otù ọgaranya di, o nēyi kwa uwe ododo na ezi ákwà ọcha, ọ nēme kwa ka obi nātọ ya utọ nke-ọma kwa-ubọchi:
20. ma atọb͕ọrọri otù ob͕eye n'ọnu-uzọ-amá-ya, aha-ya bu Lazarọs, nke ọnyá juru ya n'aru,
21. onye ọ nāgu kwa ka ewere irighiri nri nke si na table nke ọgaranya ahu dapu me ka afọ ju ya; e, ọbuná nkita nābia racha ọnyá-ya.
22. O we rue na ob͕eye ahu nwuru, ndi-mọ-ozi we bupu ya ga n'ebe ọ dabere n'obì Abraham: ọgaranya ahu nwukwara, ewe lìe ya.
23. Nime Hedis o we welie anya-ya elu, ebe ọ nọ na nmekpa-aru, ọ hu Abraham n'ebe di anya, na Lazarọs ka ọ dabere n'obì-ya.
24. Ọgaranya ahu we kpọ òkù, si, Nna, Abraham, merem ebere, zite Lazarọs, ka ọ detu ọnu-ọ̀nu nkpisi-aka-ya na miri, we mejua irem; n'ihi na anọm n'aru-ufu nime ire-ọku a.
25. Ma Abraham síri, Nwam, cheta na i nara ezi ihe-gi na ndu-gi, otù ahu Lazarọs narakwara ajọ ihe-ya: ma ub͕u a anākasi ya obi n'ebe a, ma gi onwe-gi nọ n'aru-ufu.
26. Ma n'ihe ndia nile, emewo ka oké olùlù disie ike n'ab͕ata ayi na unu, ka ndi nāchọ isi n'ebe a gabiga ijekuru unu we ghara inwe ike, ka onye ọ bula ghara kwa isi n'ebe ahu gabiga biakute ayi.
27. O we si, Ya mere ariọm gi, nna, ka i ziga ya n'ulo nnam;
28. n'ihi na enwerem umu-nne ise; ka o we dọ ha aka na nti, ka ha onwe-ha ghara ibia kwa n'ebe nmekpa-aru a.
29. Ma Abraham siri, Ha nwere Moses na ndi-amuma; ka ha nuru olu-ha.
30. O we si, É-è, nna Abraham: kama ọ buru na otù onye esite na ndi nwuru anwu jekuru ha, ha gēchèghari.
31. O we si ya, Ọ buru na ha anughi olu Moses na ndi-amuma, agaghi-eme kwa ka ha kweye, asi na otù onye esi na ndi nwuru anwu bilie.
About Luk Chapter 16
Read Luk Chapter 16 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Luk in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Luk
Chapter: 16
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Luk. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Luk Chapter 16 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Luk Chapter 16?
Luk Chapter 16 is part of the Book of Luk in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Luk Chapter 16 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Nkpugh Chapter 1
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6