Read Luk Chapter 18 Online
Read Luk Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Luk in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Luk and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Luk 18
Isi 18
1. O we turu ha ilu izí ha na ha aghaghi ikpe ekpere mb͕e nile, na ighara ikwe ka ike gwu ha;
2. si, Otù onye-ikpé nọ n'otù obodo, onye nādighi-atu egwu Chineke, nke nādighi-asọpuru kwa madu:
3. otù nwanyi nke di-ya nwuru nọ kwa n'obodo ahu; nwanyi ahu we nābiakute ya, nāsi, Kpeputam n'aka onye-irom.
4. Ma na mbu ọ chọghi ime ya: ma emesia ọ siri n'onwe-ya, Ọ bu ezie na adighi m-atu egwu Chineke, adighm-asọpuru kwa madu;
5. ma n'ihi na nwanyi a di-ya nwuru nēsobum, m'gēkpeputa ya, ka ọ ghara ime ka ike gwusiam site n'ọbibia ọ nābia mb͕e nile.
6. Onye-nwe-ayi we si, Nurunu ihe onye-ikpé nke nēme ajọ omume kwuru.
7. Ma Chineke, Ọ̀ gaghi-ekpeputa ndi nke Ya arọputara, ndi nākpọku Ya ehihie na abali, O nwe-kwa-ra ogologo ntachi-obi n'ebe ha nọ?
8. Asim unu, na Ọ gēkpeputa ha ọsọsọ. Otú ọ di, mb͕e Nwa nke madu gābia, Ọ̀ gāhu okwukwe n'elu uwa?
9. O we tu kwa ilu a nye ufọdu ndi tukwasiri obi n'onwe-ha na ha bu ndi ezi omume, ndi kpọkwara ndi nile fọduru ihe-efu:
10. Ndikom abua rigoro n'ulo uku Chineke ikpe ekpere; otù nime ha bu onye-Farisi, ibe-ya bu onye-ọna-utu.
11. Onye-Farisi guzoro nēkpe ekpere nye onwe-ya otú a, si, Chineke, ekelem Gi, na adighi m ka ndi fọduru n'etiti madu, ndi nāpunara madu ihe, ndi ajọ omume, ndi nākwa iko, ma-ọbu dika ọbuná onye-ọna-utu a.
12. Anamebu ọnu ub͕ò abua n'ízù ubọchi asa; anamenye otù uzọ n'uzọ iri n'ihe nile, ka ha ra, bú nke m'natara.
13. Ma onye-ọna-utu ahu guzoro n'ebe di anya, ọ chọghi kwa iweli ọbuná anya-ya le elu-igwe, kama ọ nēti aka n'obi-ya, si, Chineke, ka obi-Gi juru n'ebe mu, bú onye-nmehie, nọ.
14. Asim unu, Nwoke a ridara n'ulo-ya buru onye aguworo n'onye ezi omume kari ibe-ya: n'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ma onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.
15. Ha we kutakwara Ya umu ọhu ha, ka O we metu ha aka: ma mb͕e ndi nēso uzọ-Ya huru ya, ha bara ha nba.
16. Ma Jisus kpọrọ ha biakute Ya, si, Kwenu ka umu-ntakiri biakutem, unu eb͕ochi-kwa-la ha: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.
17. N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke nāgaghi-anara ala-eze Chineke dika nwatakiri, ọ gaghi-abà nime ya ma-ọli.
18. Otù onye-isi we jua Ya, si, Ezi Onye-ozizí, gini ka m'gēme ka m'we keta ndu ebighi-ebi?
19. Ma Jisus siri ya, Gini mere i nākpọm ezi onye? ọ dighi onye ọ bula bu ezi onye, ma-ọbughi otù Onye, bú Chineke.
20. I matawo ihe nile enyere n'iwu, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi.
21. Ma ọ siri, Ihe ndia nile ka m'ribara ama site n'okorọbia.
22. Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si ya, Otù ihe fọdu-kwa-ra gi ime: re ihe nile, ka ha ra, bú nke i nwere, kenye ndi-ob͕eye, i gēnwe kwa àkù n'elu-igwe: bia kwa, som.
23. Ma mb͕e ọ nuru ihe ndia, o wutara ya nke-uku; n'ihi na ọ bu oké ọgaranya.
24. Ma ebe Jisus huru ya, Ọ si, Le otú ọ diri ndi nwere àkù ike ibà n'ala-eze Chineke!
25. N'ihi na ọ dikariri kamel nfé isite n'anya àgìgá ba nime, kari ọgaranya ibà n'ala-eze Chineke.
26. Ma ndi nuru ya siri, Ònye kwa ka apuru izọputa?
27. Ma Ọ siri, Ihe anāpughi ime n'ebe madu nọ apuru ime n'ebe Chineke nọ.
28. Pita we si, Le, ayi onwe-ayi rapuru ihe nile nke aka ayi, we so Gi.
29. O we si ha, N'ezie asim unu, Ọ dighi onye ọ bula nke rapuru ulo, ma-ọbu nwunye, ma-ọbu umu-nne, ma-ọbu ndi muru ya, ma-ọbu umu, n'ihi ala-eze Chineke,
30. nke nāgaghi-anata kari ọtutu ihe n'oge a, nata kwa ndu ebighi-ebi n'oge nke nābia.
31. O we kuru ndi-ozi iri na abua ahu tiyere Onwe-ya, si ha, Le, ayi nārigoro Jerusalem, ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ site n'aka ndi-amuma gēmezu n'ebe Nwa nke madu nọ.
32. N'ihi na agārara Ya nye n'aka ndi mba ọzọ, me kwa Ya ihe-ọchì, me kwa Ya ihe-ihere, busa kwa Ya ọnu-miri:
33. ha gāpia kwa Ya ihe, b͕ue Ya: n'ubọchi nke-atọ Ọ gēsi kwa n'ọnwu bilie.
34. Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n'ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu.
35. O rue, mb͕e Ọ nābiaru Jeriko nso, otù onye-ìsì nānọdu n'akuku uzọ nāriọ aririọ:
36. ma ebe ọ nuru ùzù ìgwè madu ka ha nāgabiga, ọ jua isi ihe a.
37. Ha we kọrọ ya, na Jisus Onye Na-zaret nāgabiga.
38. O we tie nkpu, si, Jisus, Nwa Devid, merem ebere.
39. Ndi bu uzọ ga we bara ya nba, ka o kpuchie ọnu-ya: ma onye ahu tikariri nkpu nke-uku, si, Nwa Devid, merem ebere.
40. Jisus we guzo, si ka eduru ya biakute Ya: ma mb͕e ọ biara nso, Ọ jua ya, si,
41. Gini ka i nāchọ ka M'mere gi? Ọ́ si, Onye-nwe-ayi, ka eme ka m'hu uzọ.
42. Jisus we si ya, Ka eme ka i hu uzọ: okwukwe-gi azọputawo gi.
43. Ngwa ngwa ewe me ka ọ hu uzọ, o we nēso Ya, nēnye Chineke otuto: ndi-Ju nile, mb͕e ha huru ya, ha we to Chineke.
About Luk Chapter 18
Read Luk Chapter 18 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Luk in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Luk
Chapter: 18
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Luk. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Luk Chapter 18 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Luk Chapter 18?
Luk Chapter 18 is part of the Book of Luk in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Luk Chapter 18 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Nkpugh Chapter 1
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6