Read I. Samuel Chapter 27 Online
Read I. Samuel Chapter 27 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Samuel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Samuel and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
I. Samuel 27
Isi 27
1. Devid we si obi-ya. Ub͕u a agēkpochapum otù ubọchi site n'aka Sọl: ọ dighi ihe dirim nma kari iwepugasi onwem ba n'ala ndi Filistia; Sọl agaghi-atukwasi kwa obi-ya n'arum, ichọm ọzọ n'ókè-ala nile nke Israel: m'gēwepuga kwa onwem n'aka-ya.
2. Devid we bilie, gabiga, ya onwe-ya na nnù ndikom na ọgu iri ndi nọ n'aka-ya, biakute Ekish nwa Maok, bú eze Gat.
3. Devid we biri n'aka Ekish na Gat, ya onwe-ya na ndikom-ya, nwoke ọ bula na ulo-ya, bú Devid na ndinyom-ya abua, Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail nwayi Kamel, bú nwunye Nebal.
4. Ewe gosi Sọl na Devid ab͕alagawo rue Gat: o we ghara ichọ ya ọzọ ma-ọli.
5. Devid we si Ekish, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru-gi, ka ha nyem ebe n'otù obodo nime obodo ọhia, ka m'we biri n'ebe ahu: ma n'ìhi gini ka orù-gi gēbi n'obodo eze n'aka-gi?
6. Ekish we nye ya Ziklag n'ubọchi ahu: n'ihi ya ndi-eze Juda nwe Ziklag rue ta.
7. Ọnu-ọgugu ubọchi Devid biri n'ọhia ndi Filistia bu otù arọ zuru ezu na ọnwa anọ.
8. Devid na ndikom-ya we rigo, made imegide ndi Geshua, na ndi-Giazait, na ndi Amalek: n'ihi na ndi ahu bu ndi bi n'ala ahu, ndi sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ebe i nābà na Shua, we rue n'ala Ijipt.
9. Devid we tib͕ue ala ahu, o meghi kwa ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ma ọ chiri ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, na inyinya-ibu, na camel, na uwe, laghachi, biakute Ekish.
10. Ekish we si, Ònye ka unu madere megide ta? Devid we si, Megide Negeb nke Juda, megide kwa Negeb nke ndi Jerahmeel, megide kwa Negeb nke ndi-Kinait.
11. Ma Devid emeghi ka nwoke ma-ọbu nwayi di ndu, ime ka ha ba na Gat, ọ si, Ka ha we ghara igosi ihe bayere ayi, si, Otú a ka Devid mere, otú a ka ọ ganēme kwa ubọchi nile o nēbi n'ọhia ndi Filistia.
12. Ekish we kwere Devid, si, Ọ mewo onwe-ya ka o sì ísì ọjọ nke-uku n'etiti ndi-ya, bú Israel; ọ gābu-kwa-ram orù mb͕e ebighi-ebi.
About I. Samuel Chapter 27
Read I. Samuel Chapter 27 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Samuel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: I. Samuel
Chapter: 27
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Samuel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading I. Samuel Chapter 27 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is I. Samuel Chapter 27?
I. Samuel Chapter 27 is part of the Book of I. Samuel in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete I. Samuel Chapter 27 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5
Explore More from i Samuel
- I Samuel Chapter 15
- I. Samuel Chapter 16
- I. Samuel Chapter 2
- I Samuel Chapter 27
- I. Samuel Chapter 22
- I. Samuel Chapter 9
- I. Samuel Chapter 12