I. Ihe Emere Chapter 29

For English

Read I. Ihe Emere Chapter 29 Online

Read I. Ihe Emere Chapter 29 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ihe Emere in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Ihe Emere and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

I. Ihe Emere 29

Isi 29

1. Devid, bú eze, we si nkpọkọta Israel nile, Solomon nwam, onye Chineke rọputaworo nání ya, bu nwata, ọ di kwa nrò, ma ije-ozi a di uku: n'ihi na ọ bughi madu ka ulo uku a diri, kama ọ bu Jehova, bú Chineke.

2. Ma ewerewom ikem nile doziere ulo Chinekem ọla-edo iji me ihe ọla-edo, na ọla-ọcha iji me ihe ọla-ọcha, na ọla iji me ihe ọla, na ígwè iji me ihe ígwè, na osisi iji me ihe osisi; na nkume onyx, na nkume nhiọgide, na nkume ichọ-nma, na nke turu agwa, na nkume nile di oké ọnu-ahia, na nkume marble n'uba.

3. Ọzo kwa, n'ihi na ihe ulo Chinekem nātọm utọ, ebe m'nwere ihe nke akam, bú ọla-edo na ọla-ọcha, ewerewom ya nye ulo Chinekem, tukwasi ihe nile m'doziworo nye ulo nsọ ahu;

4. bú nnù talent ọla-edo asa na ọgu iri, nke ọla-edo Ofia, na nnù talent ọla-ọcha iri-na-asa na ọgu iri, bú nke anuchara n'ọku, iji machita mb͕idi nile nke ulo nile:

5. ọla-edo ahu bu iji me ihe ọla-edo, ọla-ọcha ahu bu kwa iji me ihe ọla-ọcha, na iji je ozi nile ọ bula n'aka ndi-ọ̀kà. Ònye kwa nēwere afọ-ofufo nye onwe-ya imejuru Jehova aka-ya ta?

6. Ndi-isi ulo nke ndi bu nna, na ndi isi ebo Israel nile, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, ọbuná rue ndi-isi ije-ozi eze, we were afọ-ofufo nye onwe-ha.

7. Ha we nye iji fè òfùfè ulo Chineke ọla-edo nnù talent iri-na-abua na ọgu iri, na orú nnù darie na nnù ise, na ọla-ọcha orú nnù talent na nnù ise, na ọla orú nnù uzọ abua na nnù ise, na ígwè orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri.

8. Ndi achọtara nkume di oké ọnu-ahia n'aka-ha we nye ha itiye n'ulo-àkù nke ulo Jehova, n'aka Jehiel onye Giashon.

9. Ndi Israel we ṅuria ọṅu, n'ihi na ha were afọ-ofufo nye onwe-ha, n'ihi na n'obi zuru okè ka ha were afọ-ofufo nye Jehova onwe-ha: ọzọ kwa, Devid, bú eze, ṅuriri ọṅu uku.

10. Devid we gọzie Jehova n'anya nkpọkọta ahu nile: Devid we si, Onye agọziri agọzi ka I bu, Jehova, bú Chineke Israel nna-ayi, site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi.

11. Jehova, Gi nwe idi-uku, na idi-ike, na ima-nma, na nmeri, na ebube: n'ihi na ihe nile di n'elu-igwe na n'uwa bu nke Gi; Jehova, Gi nwe ala-eze, Gi bu kwa Onye anēweli elu iburu ihe nile onye-isi.

12. Ma àkù ma nsọpuru nēsite n'ebe I nọ bia, Gi onwe-gi nāchi kwa ihe nile; ọ bu kwa n'aka-Gi ka ume na idi-ike di; n'aka-Gi ka ọ di kwa ime uku, na ime ka ihe nile di ike.

13. Ma ub͕u a, Chineke-ayi, ayi onwe-ayi nēkele Gi, nēto kwa aha-Gi mara nma.

14. Ma ònye ka mu onwem bu, òle ndi ka ndim bu kwa, na ayi nwere ike iwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ayi otú a? n'ihi na n'ebe I nọ ka ihe nile si bia, ọ bu kwa ihe si n'aka-Gi bia ka ayi nyere Gi.

15. N'ihi na ndi-ọbìa ka ayi bu n'iru Gi, na ndi-nnọdu, dika nna-ayi-hà nile: ubọchi nile ayi n'elu uwa di ka onyinyo, olile-anya adighi kwa.

16. Jehova, bú Chineke-ayi, ọtutu ihe nile a nke ayi doziworo iwuru Gi ulo n'ihi aha nsọ Gi, n'aka-Gi ka o siri bia, ọ bu kwa Gi nwe ya nile.

17. Chinekem, ama-kwa-ram na Gi onwe-gi nānwaputa obi, izi-ezi nātọ kwa Gi utọ. Mu onwem, n'izi-ezi obim ka m'were afọ-ofufo nye Gi ihe nile ndia: ma ub͕u a ndi-gi, ndi ahutara n'ebe a, ewerewom ọṅù hu ha ka ha nēwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ha.

18. Jehova, Chineke nke Abraham na Aisak na Israel, bú nna-ayi-hà, debe nka nime nchèputa nke èchìchè nile nke obi ndi-Gi rue mb͕e ebighi-ebi, me kwa ka obi-ha guzosie ike n'ebe I nọ:

19. nye kwa Solomon nwam obi zuru okè, idebe ihe nile I nyere n'iwu, na ihe-àmà-Gi nile, na ukpuru-Gi nile, na ime ihe ndia nile, na iwu ulo uku ahu, nkem'doziworo ihe bayere ya.

20. Devid we si nkpọkọta ahu nile, Biko, gọzienu Jehova, bú Chineke-unu. Nkpọkọta ahu nile we gọzie Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, ha we rube isi, kpọ isi ala nye Jehova, nye kwa eze.

21. Ha we chuara Jehova àjà, sure-kwa-ra Jehova àjà-nsure-ọku, n'echi ubọchi ahu, bú nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù ebulu abua na ọgu iri, na nnù umu-aturu abua na ọgu iri, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha, ọbuná àjà n'uba bayere Israel nile;

22. ha we were ọṅù uku rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Jehova ubọchi ahu. Ha we me Solomon nwa Devid eze nke ub͕ò abua, te ya manu nye Jehova ibu onye-ndú, ha te-kwa-ra Zedok manu ibu onye-nchu-aja.

23. Solomon we nọkwasi n'oche-eze Jehova, buru eze n'ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti.

24. Ndi-isi nile, na ndi-dike, na umu-ndikom nile kwa nke eze, bú Devid, kweye-kwa-ra inọ n'okpuru Solomon, bú eze.

25. Jehova we me ka Solomon di uku ri nne n'anya Israel nile, O we tiyekwasi ya ebube ala-eze nke anātukwasighi eze Israel ọ bula nke buru ya uzọ.

26. Ma Devid nwa Jesi bu eze Israel nile.

27. Ma ubọchi nile ọ bu eze Israel di ọgu arọ abua; arọ asa ka ọ bu eze na Hebron, orú arọ na iri na atọ ka ọ bu kwa eze na Jerusalem.

28. O we nwua n'ezi isi-awọ, ubọchi nile nke ndu-ya na àkù na nsọpuru ju-kwa-ra ya afọ: Solomon nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

29. Ma ihe nile Devid, bú eze, mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere nke Samuel, bú onye-ọhu-uzọ, na n'akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n'akwukwọ ihe emere nke Gad, bú onye-ọhu-uzọ;

30. tiyere ọbubu-eze-ya nile, na idi-ike-ya, na mb͕e nile nke gabigara n'isi ya, na n'isi Israel, na n'isi ala-eze nile nke ala di iche iche.

About I. Ihe Emere Chapter 29

Read I. Ihe Emere Chapter 29 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ihe Emere in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: I. Ihe Emere
Chapter: 29
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Ihe Emere. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading I. Ihe Emere Chapter 29 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is I. Ihe Emere Chapter 29?

I. Ihe Emere Chapter 29 is part of the Book of I. Ihe Emere in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete I. Ihe Emere Chapter 29 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from i-ihe-emere

  1. I. Ihe Emere Chapter 28
  2. I. Ihe Emere Chapter 6
  3. I. Ihe Emere Chapter 14
  4. I. Ihe Emere Chapter 2
  5. I. Ihe Emere Chapter 9
  6. I. Ihe Emere Chapter 16
  7. I. Ihe Emere Chapter 10

Related Chapters & Readings

  1. Ndi-Ikpe Chapter 14
  2. II. Ndi-Eze Chapter 6
  3. I. Ndi-Eze Chapter 9
  4. II. Ihe Emere Chapter 7
  5. II. Pita Chapter 3
  6. Jona Chapter 2
  7. Job Chapter 29
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *