Read Deuteronomi Chapter 20 Online
Read Deuteronomi Chapter 20 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Deuteronomi in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Deuteronomi and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Deuteronomi 20
Isi 20
1. Mb͕e i nāpù ibuso ndi-iro-gi agha, i we hu inyinya, na ub͕o-ala, na ndi bara uba kari gi, atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa.
2. O gēru kwa, mb͕e unu nābiaru nso agha ahu, na onye-nchu-àjà gābiaru nso gwa ndi Israel okwu,
3. si ha, Nuru, Israel, unu onwe-unu nābiaru nso agha ta imegide ndi-iro-unu: ka obi-unu ghara ilọ unu miri; unu atula egwu, unu akuja-kwa-la akuja, unu ama-kwa-la jijiji n'iru ha;
4. n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, bu onye nēso unu je, iburu unu agha megide ndi-iro-unu, ka O we zọputa unu.
5. Ndi-ọchi-agha gāgwa ndi Israel okwu, si, Ònye bu nwoke nke wuworo ulo ọhu, ma ọ kāraghi ya nye Chineke? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe ra ya nye Chineke.
6. Ònye bu kwa nwoke nke kuworo ubi-vine, ma ọ kēmeghi ka ọ pua na nsọ anāsọ ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe me ka ọ pua na nsọ anāsọ ya.
7. Ònye bu kwa nwoke nke kwere ilu nwayi, ma o kēkubataghi ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe kubata ya.
8. Ndi-ọchi-agha gāgwa kwa ndi Israel okwu ọzọ, si, Ònye bu nwoke nke nātu egwu, nke obi nālọ kwa ya miri? ya je laghachi n'ulo-ya, ka obi umu-nne-ya we ghara imebi dika obi-ya.
9. O gēru kwa, mb͕e ndi-ọchi-agha gwabisiri ndi Israel okwu, na ha gēme ndi-isi nke usu nile nke ndi-agha ka ha buru ndi-nlekọta nēlekọta ndi Israel.
10. Mb͕e i nābiaru nso obodo ibuso ya agha, i gākpọ kwa ya òkù udo.
11. O gēru kwa, ọ buru na ọ za gi okwu udo, meghe-kwa-ra gi uzọ-ya, ọ gēru kwa, na ndi nile anāhuta nime ya gāghọrọ gi ndi nēfè òfùfè, ha gēfè kwa gi òfùfè.
12. Ma ọ buru na ọ kweghi ka gi na ya di n'udo, kama ọ nēbuso gi agha, i gānọchigide kwa ya n'agha:
13. Jehova, bú Chineke-gi, gēnye kwa ya n'aka-gi, i gēwere kwa ọnu mma-agha tib͕ue nwoke-ya ọ bula:
14. nání na i gālutara onwe-gi ndinyom, na umu-ntakiri, na anu-ulo, na ihe nile nke di n'obodo ahu, n'agha, bú ihe-nkwata-ya nile; i gēri kwa ihe-nkwata ndi-iro-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.
15. Otú a ka i gēme obodo nile nke dipuru gi anya nke-uku, nke nādighi nime obodo nile nke mba ndia.
16. Ma emela ka ihe ọ bula nke nēku ume di ndu site n'obodo nile nke ndi ndia nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka ha buru ihe-nketa.
17. N'ihi na i ghaghi iwezuga ka ha ebibie ha; bú ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus; dika Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi iwu:
18. ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu.
19. Mb͕e i gānọchigide obodo n'agha ọtutu ubọchi, n'ibuso ya agha iwere ya, ebibila osisi-ya n'ifekwasi ha anyu-ike; n'ihi na ọ bu ihe sitere na ha ka i gēri, eb͕utu-kwa-la ha; n'ihi na osisi nke di n'ọhia, ọ̀ bu madu, ibà n'iru gi na nnọchigide-n'agha ahu?
20. Nání osisi nke i mara na ọ dighi osisi ihe-oriri ha bu, osisi ahu ka i gēbibi b͕utu kwa ha; i gēwu kwa ihe-nnọchigide-n'agha imegide obodo ahu nke nēbuso gi agha, rue mb͕e ọ dara.
About Deuteronomi Chapter 20
Read Deuteronomi Chapter 20 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Deuteronomi in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Deuteronomi
Chapter: 20
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Deuteronomi. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Deuteronomi Chapter 20 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Deuteronomi Chapter 20?
Deuteronomi Chapter 20 is part of the Book of Deuteronomi in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Deuteronomi Chapter 20 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Esta Chapter 1
- Aisaia Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Esta Chapter 5
- Esta Chapter 4
- Job Chapter 33
- Esta Chapter 7
Explore More from Deuteronomi
- Deuteronomi Chapter 11
- Deuteronomi Chapter 28
- Deuteronomi Chapter 1
- Deuteronomi Chapter 26
- Deuteronomi Chapter 15
- Deuteronomi Chapter 8
- Deuteronomi Chapter 22