Ndi Kọlọsi Chapter 2

For English

Read Ndi Kọlọsi Chapter 2 Online

Read Ndi Kọlọsi Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi Kọlọsi in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Ndi Kọlọsi and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Ndi Kọlọsi 2

Isi 2

1. N'ihi na anamachọ ka unu mata otú m'nāb͕asi nb͕a ike nke-uku n'ihi unu na ndi bi na Leọdisia na ka ha ra, bú ndi akāhughi irum n'anu-aru;

2. ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n'ihu-n'anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist,

3. Onye àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe zoro ezo nime Ya.

4. Nka ka m'nēkwu, ka onye ọ bula we ghara iwere ire-utọ rafue unu.

5. N'ihi na ọ bu ezie na anọghm n'etiti unu n'anu-arum, ma anọm n'etiti unu na mọm, nāṅuri, nēle kwa usoro-unu na otú okwukwe unu kwere na Kraist di ike.

6. Ya mere dika unu nara Kraist-ayi, bú Jisus Onye-nwe-ayi, nējegharinu nime Ya,

7. buru kwa ndi b͕agideworo nkpọrọgwu nime Ya, ndi anēwuli kwa elu dika ulo nime Ya, ndi anēwere kwa okwukwe-unu me ka unu guzosie ike, dika ezíri unu, nēkelebiga ókè.

8. Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iwere ihu-amam-ihe-n'anya na aghughọ efu nke ya buru onye nēzu unu n'ori, ihu-amam-ihe-n'anya nke di ka ihe-ozizí madu nyere idebe, dika ozizí mbu nke uwa, ma ọ dighi ka Kraist si di:

9. n'ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu,

10. nime Ya ka emezuwo-kwa-ra unu emezu, Onye bu isi nke ibu-onye-isi na ichi-isi nile ọ bula:

11. ọ bu kwa nime Ya ka ejiri obibì-úgwù anējighi aka me bì unu úgwù, n'iyipuchasi aru nile nke bu anu-aru, n'obibì-úgwù nke Kraist;

12. ebe elìkọrọ unu na Ya nime baptism-unu, ọ bu kwa nime ya ka esitere n'aka okwukwe-unu me ka unu so Ya bilikọ, bú okwukwe unu kwere n'ilusi-ọlu-ike nke Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.

13. Unu onwe-unu kwa, mb͕e unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na ebìghi-úgwù nke anu-aru-unu, ọbuná unu ka O mere ka unu so Ya dikọ ndu, mb͕e O weresiri amara b͕aghara ayi ndahie-ayi nile;

14. mb͕e O hichapusi-kwa-ra ihe ayi ji aka-ayi de n'akwukwọ ike onwe-ayi ab͕u, nke megidere ayi, bú ihe edere n'iwu nke enyere ayi, nke nēguzogide ayi: O wepuwo kwa ya n'etiti ayi na Ya, nākpọgide ya n'obe-Ya;

15. mb͕e O yipuchasiri n'aru ibu-ndi-isi nile na ichi-isi nile ihe-agha-ha nye Onwe-ya, O were nkwuwa-okwu gosi ha n'iru ọra, nēdughari ha n'ọṅù-agha n'elu obe-Ya.

16. Ya mere, unu ekwela ka onye ọ bula kpo unu n'oriri, ma-ọbu n'ọṅuṅu, ma-ọbu n'okwu ubọchi ememe ma-ọbu nke ọnwa ọhu ma-ọbu nke ubọchi-izu-ike:

17. nke bu onyinyo nke ihe gaje ibia; ma aru bu nke Kraist.

18. Unu ekwela ka onye ọ bula me ihe ọ nāchọ n'ipunara unu ihe unu nāb͕ata n'ọsọ, site n'obi di ume-ala na ikpere ndi-mọ-ozi, nēguzo n'ihe ọ huworo, onye uche nke anu-aru-ya nāfuli elu n'efu,

19. ọ dighi-ejidesi kwa Isi-ayi ike, Onye aru nile, ebe esitere na nkwonkwo-ya na akwara-ya nile nyezu ya ihe jikọ kwa ya n'otù, o sitere na Ya nāba uba nke Chineke.

20. Ọ buru na unu na Kraist nwukọrọ anwu pua n'ihe-ozizí mbu nke uwa, gini mere, dika agāsi na unu nādi ndu n'uwa, unu nēdo onwe-unu n'okpuru iwu di iche iche enyere,

21. Ejidela, edetu-kwa-la ire, emetu-kwa-la aka

22. (bú ihe agēmebi ha nile emebi n'iji ha me ihe), dika ihe enyere n'iwu na ozizí madu si di?

23. Ọ bu ezie na ihe di otú a nwere nke anākpọ amam-ihe n'ikpe ekpere dika madu chọrọ, n'inwe kwa obi di ume-ala, n'ime kwa ka aru hu ahuhu; ma ha abughi ihe di oké ọnu-ahia ma-ọli megide ime ihe ọjọ nke gēju anu-aru afọ.

About Ndi Kọlọsi Chapter 2

Read Ndi Kọlọsi Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Ndi Kọlọsi in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Ndi Kọlọsi
Chapter: 2
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Ndi Kọlọsi. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Ndi Kọlọsi Chapter 2 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Ndi Kọlọsi Chapter 2?

Ndi Kọlọsi Chapter 2 is part of the Book of Ndi Kọlọsi in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Ndi Kọlọsi Chapter 2 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 10
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 14
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from Ndi Kọlọsi

  1. Ndi Kọlọsi Chapter 3
  2. Ndi Kọlọsi Chapter 4
  3. Ndi Kọlọsi Chapter 1

Related Chapters & Readings

  1. Ọnu-Ọgugu Chapter 35
  2. Job Chapter 37
  3. Jọn Chapter 19
  4. Ọpupu Chapter 3
  5. Abù Ọma Chapter 43
  6. I. Ndi-Eze Chapter 6
  7. Aisaia Chapter 6
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *