II. Samuel Chapter 10

For English

Read II. Samuel Chapter 10 Online

Read II. Samuel Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Samuel in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Samuel and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

II. Samuel 10

Isi 10

1. O rue, mb͕e ihe a gasiri, na eze umu Amon nwuru, Hanun nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

2. Devid we si, M'gēmere Hanun nwa Nehash ebere, dika nna-ya merem ebere. Devid we ziga ikasi ya obi bayere nna-ya site n'aka ndi-orú-ya. Ndi-orù Devid we ba n'ala umu Amon.

3. Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, bú onye-nwe-ha, Devid, ọ́ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa obodo a, na iledo ya, na ikwatu ya, ka Devid zitere ndi-orù-ya ibiakute gi?

4. Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu nkera nke afu-ọnu-ha, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.

5. Ha we gosi Devid, o ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.

6. Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.

7. Devid we nu ya, ziga Joab, na usu-ndi-agha nile, bú ndi-dike.

8. Umu Amon we puta, do agha n'usoro n'oghere ọnu-uzọ-ama: Siria Zoba, na Rehob, na ndikom Tob, na Meaka, nọrọ onwe-ha n'ọhia.

9. Joab we hu na iru agha ahu di megide ya iru na azu, o we rọputa ufọdu n'etiti ndi nile arọputara arọputa n'Israel, do ha n'usoro izute Siria:

10. o tiye ndi Israel fọduru n'aka Abishai, bú nwa-nne-ya, we do ha n'usoro izute umu Amon.

11. Ọ si, Ọ buru na Siria akariam ike, i gābu-kwa-ram onye-nzọputa: ma ọ buru na umu Amon akaria gi ike, m'gābia kwa izọputa gi.

12. Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.

13. Joab na ndi soro ya we biarue agha ahu nso imegide Siria: ha we b͕alaga n'iru ya.

14. Umu Amon we hu na Siria ab͕alagawo, ha onwe-ha we b͕alaga kwa n'iru Abishai, ba n'obodo. Joab we si n'ebe umu Amon nọ lata, biarue Jerusalem.

15. Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we chikọta onwe-ha n'otù.

16. Hedareza we ziga, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta: ha we biarue Hilam, Shobak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha.

17. Ewe gosi Devid; o we chikọta Israel nile, gabiga Jọdan, biarue Hilam. Siria we do onwe-ha n'usoro izute Devid, ha we buso ya agha.

18. Siria we b͕alaga n'iru Israel; Devid we b͕ue n'etiti ndi Siria ndikom nke nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri-na-ise, na orú nnú ndi-inyinya uzọ ise; o tib͕u-kwa-ra Shobak, bú onye-isi usu-ndi-agha-ha, o we nwua n'ebe ahu.

19. Eze nile, bú ndi-orù Hedareza, we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Israel di n'udo, we fè ha òfufè. Siria we tua egwu izọputa umu Amon ọzọ.

About II. Samuel Chapter 10

Read II. Samuel Chapter 10 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Samuel in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: II. Samuel
Chapter: 10
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Samuel. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading II. Samuel Chapter 10 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is II. Samuel Chapter 10?

II. Samuel Chapter 10 is part of the Book of II. Samuel in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete II. Samuel Chapter 10 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from ii Samuel

  1. II. Samuel Chapter 7
  2. II. Samuel Chapter 19
  3. II Samuel Chapter 1
  4. II. Samuel Chapter 2
  5. II Samuel Chapter 3
  6. II. Samuel Chapter 8
  7. II Samuel Chapter 5

Related Chapters & Readings

  1. Luk Chapter 7
  2. Rut Chapter 3
  3. Ọpupu Chapter 16
  4. Zekaraia Chapter 10
  5. Emos Chapter 1
  6. Ọnu-Ọgugu Chapter 32
  7. Aisaia Chapter 7
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *