Read Hosea Chapter 4 Online
Read Hosea Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Hosea in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Hosea and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Hosea 4
Isi 4
1. Nurunu okwu Jehova, umu Israel: n'ihi na ikpé ka Jehova na ndi bi n'ala nka gēkpe, n'ihi na ọ dighi ezi-okwu, ọ dighi kwa ebere, ọ dighi kwa ọmuma Chineke, di n'ala nka.
2. Ọ bu nání ọb͕ub͕a-iyi, na okwu-ugha, na ob͕ub͕u-madu, na izu-ori, na ikwa-iko; ha etipúwo etipú, iwusi-ọbara-madu emetuwo kwa iwusi-ọbara-madu.
3. N'ihi nka ka ala nka gēru újú, onye ọ bula nke bi nime ya gāta kwa aru, ya na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe; ọ bu kwa azù nile nke oké osimiri ka agēkpochapu.
4. Ma otú ọ di, ka onye ọ bula ghara ise okwu, ka onye ọ bula ghara kwa iba nba; n'ihi na ndi-gi di ka ndi nēseso onye-nchu-àjà okwu.
5. I gāsu kwa ngọngọ n'ehihie, ọzọ, onye-amuma gēso kwa gi su ngọngọ n'abali; M'gēme kwa ka nne-gi la n'iyì.
6. Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.
7. Dika iba-uba-ha, otú a ka ha mehieworo megidem: nsọpuru-ha ka M'gāb͕anwe ka ọ ghọ ihere.
8. Nmehie ndim ka ha nēri, ọ bu kwa ajọ omume-ha ka ha nēbuli, onye ọ bula nkpuru-obi-ya, nye.
9. Ọ gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà: M'gēji kwa uzọ-ya nile leta ya, ọ bukwa omume-ya nile ka M'gēnyeghachi ya.
10. Ha eriwo kwa ihe, ma afọ agaghi-eju ha; ha akwawo iko, ma ha agaghi-aba uba kari: n'ihi na ha arapuwo inu olu Jehova.
11. Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe.
12. Ndim nāju ase n'aka osisi-ha, nkpa-n'aka-ha nēgosi kwa ha ihe: n'ihi na mọ nke ikwa-iko nile emewo ka ha kpafue, ha we pua n'okpuru Chineke-ha kwa iko.
13. N'elu ugwu nile ka ha nāchu àjà, n'elu ugwu ntà nile ka ha nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, n'okpuru osisi oak na osisi poplar na osisi terebinth, n'ihi na ǹdò-ya di nma: n'ihi nka ka umu-unu ndinyom nākwa iko, ọ bu kwa n'ihi nka ka ndinyom unu luworo ọhu nākwa iko.
14. M'gaghi-eji nmehie-ha leta umu-unu ndinyom mb͕e ha nākwa iko, M'gāghi-eji kwa nmehie-ha leta ndinyom unu luworo ọhu mb͕e ha nākwa iko; n'ihi na ha onwe-ha nēwezuga onwe-ha so ndinyom nākwa iko, ha nēso kwa ndinyom edoro nsọ ikwa iko chua àjà: ma ndi ọ bula nke nādighi-aghọta ka agākwatu n'ala.
15. Ọ bu ezie na onye nākwa iko ka i bu, Israel, ma ka ikpe ghara ima Juda; unu abia-kwa-la na Gilgal, unu arigo-kwa-la na Bet-even, unu aṅu-kwa-la iyi, si, Jehova nādi ndu.
16. N'ihi na Israel ewezugawo onwe-ya, dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nēwezuga onwe-ya: ub͕u a ka Jehova gāzù ha dika nwa-aturu n'ebe sara mbara.
17. Onye ekekọtaworo n'arusi di iche iche ka Efraim bu; kwe ka ọ nọduru onwe-ya.
18. Iṅubiga-manya-ókè-ha ewezugawo onwe-ya: ha akwachiwo iko nti; ndi bu ọta-ha ahuwo ihere n'anya nke-uku.
19. Ifufe apiakọtawo ya na nkù-ya; ihere àjà nile ha gēme kwa ha.
About Hosea Chapter 4
Read Hosea Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Hosea in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Hosea
Chapter: 4
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Hosea. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Hosea Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Hosea Chapter 4?
Hosea Chapter 4 is part of the Book of Hosea in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Hosea Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Esta Chapter 1
- Aisaia Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Esta Chapter 5
- Esta Chapter 4
- Job Chapter 33
- Esta Chapter 7
Explore More from Hosea
- Hosea Chapter 2
- Hósea Chapter 1
- Hosea Chapter 12
- Hosea Chapter 2
- Hosea Chapter 11
- Hosea Chapter 5
- Hosea Chapter 11