I. Ndi Kọrint Chapter 3

For English

Read I. Ndi Kọrint Chapter 3 Online

Read I. Ndi Kọrint Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Kọrint in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Ndi Kọrint and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

I. Ndi Kọrint 3

Isi 3

1. Mu onwem kwa, umu-nnam, apughi m igwa unu okwu dika ndi Mọ Nsọ nāchi, kama dika ndi bu nání anu-aru, dika umu ọhu nime Kraist.

2. Ejirim ara zù unu, ọ bughi ihe-oriri; n'ihi na unu akāpughi inagide ya; é-è, ọbuná ub͕u a unu apughi;

3. n'ihi na unu bu ndi anu-aru nāchi rue ub͕u a: n'ihi na ebe ekworo na esem-okwu di n'etiti unu, ùnu abughi ndi anu-aru nāchi, ndi nējeghari kwa dika madu?

4. N'ihi na mb͕e ọ bula otù onye nāsi, Mu onwem bu nke Pọl; mb͕e ibe-ya nāsi kwa, Mu onwem bu nke Apọlos; ùnu abughi madu efu?

5. Gini kwa bu Apọlos? gini bu kwa Pọl? Ndi nēje ozi, ndi unu si n'aka-ha kwere; dika Onye-nwe-ayi nye-kwa-ra ha abua n'otù n'otù.

6. Mu onwem kuru osisi, Apọlos kwọsara ya miri; ma ọ bu Chineke nēme ka ọ nāba uba.

7. Ya mere onye nāku abughi ihe ọ bula, onye nākwọsa miri abughi kwa ihe ọ bula; kama Chineke, Onye nēme ka ọ nāba uba, bu ihe nile.

8. Ma onye nāku na onye nākwọsa miri bu otù: ma ha abua n'otù n'otù gānata ugwọ-ọlu nke aka ha, onye ọ bula dika ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu si di.

9. N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu.

10. Dika amara Chineke nke enyerem si di, dika onye-isi-ọ̀kà nke mara ihe, atọrọm ntọ-ala; onye ọzọ nēwu kwa ulo n'elu ya. Ma ka onye ọ bula lezi anya otú ọ nēwu ulo n'elu ya.

11. N'ihi na ọ dighi onye ọ bula puru itọ ntọ-ala ọzọ ma-ọbughi Nke atọworo, Nke bu Jisus Kraist.

12. Ma ọ buru na onye ọ bula ewukwasi ọla-edo, ọla-ọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahihia, okporo-ọka, n'elu ntọ-ala ahu;

13. agēme ka ọlu nke madu nile n'otù n'otù puta ìhè: n'ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n'ihi na agaje ikpughe ya n'ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n'otù n'otù, aha ọlu ọ bu.

14. Ọ buru na ọlu onye ọ bula gādigide nke o wukwasiri ya, ọ gānata ugwọ-ọlu.

15. Ọ buru na agērechapu ọlu onye ọ bula n'ọku, ọ gēyi iyì: ma agāzọputa ya onwe-ya; ma ọ bu dika onye azọputara n'ọku.

16. Ùnu amataghi na unu bu ulo nsọ Chineke, Mọ nke Chineke bi kwa nime unu?

17. Ọ buru na onye ọ bula emebi ulo nsọ Chineke, onye ahu ka Chineke gēmebi; n'ihi na ulo nsọ Chineke di nsọ, otú a ka unu di kwa.

18. Ka onye ọ bula ghara ighọb͕u onwe-ya. Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya bu onye mara ihe n'etiti unu n'oge a, ya ghọ onye-nzuzu, ka o we ghọ onye mara ihe.

19. N'ihi na amam-ihe nke uwa nka bu ihe-nzuzu n'ebe Chineke nọ. N'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha:

20. ọzọ kwa, Onye-nwe-ayi mara ihe ndi mara ihe nātule n'obi-ha, na ha bu ihe-efu.

21. Ya mere onye ọ bula anyala isi na madu. N'ihi na ihe nile bu nke unu;

22. ma ọ bu Pọl, ma-ọbu Apọlos, ma-ọbu Kifas, ma-ọbu uwa, ma-ọbu ndu ma-ọbu ọnwu, ma-ọbu ihe di ub͕u a, ma-ọbu ihe gaje idi; ihe nile bu nke unu;

23. ma unu onwe-unu bu ndi nke Kraist; ma Kraist bu nke Chineke.

About I. Ndi Kọrint Chapter 3

Read I. Ndi Kọrint Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Ndi Kọrint in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: I. Ndi Kọrint
Chapter: 3
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Ndi Kọrint. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading I. Ndi Kọrint Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is I. Ndi Kọrint Chapter 3?

I. Ndi Kọrint Chapter 3 is part of the Book of I. Ndi Kọrint in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete I. Ndi Kọrint Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 7

Explore More from i-ndi-kọrint

  1. I. Ndi Kọrint Chapter 15
  2. I. Ndi Kọrint Chapter 1
  3. I. Ndi Kọrint Chapter 13
  4. I. Ndi Kọrint Chapter 16
  5. I. Ndi Kọrint Chapter 8
  6. I. Ndi Kọrint Chapter 11
  7. I. Ndi Kọrint Chapter 2

Related Chapters & Readings

  1. Ndi Kọlọsi Chapter 2
  2. Luk Chapter 16
  3. Deuteronomi Chapter 21
  4. Abù Nke Abù Chapter 5
  5. Daniel Chapter 10
  6. Deuteronomi Chapter 4
  7. Ndi Filipai Chapter 3
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *