Read Esta Chapter 6 Online
Read Esta Chapter 6 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Esta in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Esta and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
Esta 6
Isi 6
1. N'abali ahu urá eze fepuru n'anya-ya; o we si ka ewebata akwukwọ ihe-ncheta nke ihe emere n'ubọchi ahu, ewe nāgu ha n'iru eze.
2. Ewe hu ihe a nke edere n'akwukwọ, bú na Mọdekai gosiri ihe bayere Bignata na Teresh, bú ndi-onozi abua nke eze, nime ndi nēche ngata-uzọ, ndi chọrọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.
3. Eze we si, Nsọpuru na idi-uku gini ka emere Mọdekai n'ihi ihe a? Ndi-ozi eze, bú ndi nējere ya ozi, we si, Ọ dighi ihe emere ya.
4. Eze we si, Ònye nọ n'ogige? Ma Heman abatawo n'ogige ulo eze nke di n'èzí, isi eze ka ọ kwuba Mọdekai n'osisi nke o doziri nye ya.
5. Ndi nējere eze ozi we si ya, Le, Heman nēguzo n'ogige. Eze we si, Ya bata.
6. Heman we bata. Eze we si ya, Gini ka agēme nwoke ahu, bú onye nsọpuru-ya tọworo eze utọ? Heman we si n'obi-ya, Ònye ka ọ nātọ eze utọ inye nsọpuru karim?
7. Heman we si eze, Nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ,
8. ka achita uwe ala-eze nke eze yiriworo, na inyinya nke eze nọkwasiworo, na okpu-eze nke ala-eze nke ekpukwasiworo ya n'isi:
9. ka enye kwa uwe ahu na inyinya ahu n'aka otù nwoke nime ndi-isi eze, ndi bu eze, ka ha yikwasi kwa nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ, ka ha me kwa ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ka ha kpọ kwa n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.
10. Eze we si Heman, Me ngwa, chiri uwe ahu na inyinya ahu, dika i si kwu, me-kwa-ra Mọdekai otú a, bú onye-Ju, nke nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze: ka okwu ọ bula ghara idapu n'ihe nile nke i kwuworo.
11. Heman we chiri uwe ahu na inyinya ahu, yikwasi Mọdekai, me ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ọ kpọ-kwa-ra n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.
12. Mọdekai we laghachi n'ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n'ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya.
13. Heman we kọrọ Zeresh, bú nwunye-ya, kọ-kwa-ra ndi nile nāhu ya n'anya, ihe nile nke mere ya. Ndi-ya mara ihe na Zeresh, bú nwunye-ya, we si ya, Ọ buru na Mọdekai sitere na nkpuru ndi-Ju, bú onye i maliteworo ida n'iru ya, i gaghi-enwe ike imegide ya, kama i ghaghi ida n'iru ya.
14. Mb͕e ha na ya nọ nēkwurita okwu, ndi-onozí eze biaruru nso, we me ngwa ime ka Heman bata n'ọṅuṅu-manya-vine nke Esta mere.
About Esta Chapter 6
Read Esta Chapter 6 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Esta in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: Esta
Chapter: 6
Testament: Old Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Esta. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading Esta Chapter 6 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is Esta Chapter 6?
Esta Chapter 6 is part of the Book of Esta in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete Esta Chapter 6 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ochie
- Aisaia Chapter 1
- Esta Chapter 1
- Ilu Chapter 11
- Ilu Chapter 12
- Jenesis Chapter 13
- Emos Chapter 1
- Jenesis Chapter 5