Read I. Timọti Chapter 3 Online
Read I. Timọti Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Timọti in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Timọti and the Holy Bible online.
Choose a Chapter
I. Timọti 3
Isi 3
1. Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, Ọ buru na onye ọ bula nāb͕aso ọnọdu onye nēlekọta nzukọ Kraist anya, agu ọlu ọma nāgu ya.
2. Ya mere onye nēlekọta nzukọ Kraist anya aghaghi ibu onye anādighi-akalu, di nke otù nwunye, onye-anya-udo, onye uche-ya zuru okè, onye omume-ya kwesiri ekwesi, onye nēle ndi-ọbìa anya nke-ọma, onye nwere ike izí ihe;
3. onye nādighi-ese okwu site n'iṅubiga manya ókè, onye nādighi-eti madu aka; kama onye nwere obi-ọma, onye nādighi-alu ọ̀gù, onye nādighi-ahu ego n'anya;
4. onye nāchi èzí-na-ulo nke aka ya nke-ọma, nēnwe kwa umu-ya n'okpuru ya n'ikwesi-nsọpuru nile;
5. (ma ọ buru na onye ọ bula amataghi otú ọ gāchi èzí-na-ulo nke aka ya, ò gēsi aṅa le nzukọ Chineke anya nke-ọma?)
6. onye nābughi onye ọhu, ka aghara ifuli ya elu, o we dabà n'ọmuma-ikpé ekwensu.
7. Ma ọ ghaghi kwa inwe àmà di nma site n'ọnu ndi nọ n'èzí; ka ọ ghara idabà n'ita-uta, ya na ima n'ọnyà ekwensu.
8. Otú ahu ndi nējere nzukọ Kraist ozi aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nēnweghi ire abua, ndi nādighi-aṅubiga manya ókè, ndi akpiri urù nke nēweta ihere nādighi-akpọ ha nku;
9. ndi nēnwe ihe-omimi nke okwukwe-ayi nime akọ-na-uche di ọcha.
10. Ma ka eburu uzọ nwa kwa ndia; mb͕e ahu ka ha jebe ozi, ma ọ buru na ha bu ndi anāpughi ibo ebubo.
11. Otú ahu ndinyom aghaghi ibu ndi kwesiri nsọpuru, ndi nādighi-ebo madu ebubo ugha, ndi nwere anya-udo, ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ihe nile.
12. Ka ndi nējere nzukọ Kraist ozi buru di nke otù nwanyi, nāchi umu-ha na èzí-na-ulo nke aka ha nke-ọma.
13. N'ihi na ndi jeworo ozi nke-ọma nēnwetara onwe-ha ọnọdu ọma, na oké nkwuwa-okwu nime okwukwe nke ekwere na Kraist Jisus.
14. Ihe ndia ka m'nēdegara gi n'akwukwọ, ọ bu ezie na anamele anya ibiakute gi na mb͕e ntà;
15. ma ọ buru na m'nānọ ọdù, ka i we mata otú anāghaghi ibi obi n'èzí-na-ulo Chineke, ebe ọ bu nzukọ nke Chineke di ndu, bú ide na ntọ-ala nke ezi-okwu.
16. Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nke nsọpuru-Chineke; Onye ahu Nke emere ka Ọ puta ìhè n'anu-aru, Nke aguru Ya n'onye ezi omume nime mọ, Nke emere ka ndi-mọ-ozi hu Ya anya, Nke ekwusara Ya n'etiti ndi mba ọzọ, Nke ekwere na Ya nime uwa, Nke anara Ya n'elu nime ebube.
About I. Timọti Chapter 3
Read I. Timọti Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Timọti in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.
Book Information
Book: I. Timọti
Chapter: 3
Testament: New Testament
How to Read this Chapter
Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Timọti. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.
More Resources
Continue Reading the Bible
Continue reading I. Timọti Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.
Frequently Asked Questions
What is I. Timọti Chapter 3?
I. Timọti Chapter 3 is part of the Book of I. Timọti in the Holy Bible.
Can I read this chapter online?
Yes. You can read the complete I. Timọti Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.
More Chapters from Agba Ọhụrụ
- Jọn Chapter 1
- Nkpugh Chapter 1
- Nkpugh Chapter 14
- Nkpugh Chapter 10
- Nkpugh Chapter 13
- Nkpugh Chapter 7
- Nkpugh Chapter 6