Nehum Chapter 2

For English

Read Nehum Chapter 2 Online

Read Nehum Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Nehum in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Nehum and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Nehum 2

Isi 2

1. Onye-nchusa arigotawo n'iru-gi: chebe ebe ewusiri ike, che uzọ nche, me ka úkwù-gi sie ike, b͕a ike ume nke-uku.

2. N'ihi na Jehova neme ka nbili-elu nke Jekob lata, dika nbili-elu nke Israel: n'ihi na ndi-nwusi awusiwo ha dika miri, ọ bu kwa ngalaba-vine nile ha ka ha bibiworo.

3. Ọta ndi-dike-ya bu ihe esijiri ọbara-ọbara, ndi-dìnkpà-ya yiri uwe nācha uhie uhie: ígwè nēb͕upu eb͕upu ka ub͕ọ-ala-ya nwere n'ubọchi ndozi-ya, emewo ka osisi fir nile me nkpatu nke-uku.

4. N'èzí nile ka ub͕ọ-ala nile kpọtuworo nkpọtu nke-uku, ha nāb͕aghari iru na azu n'amá nile: ha di ka ọwa nēnwu enwu n'ile ha anya, dika àmùmà ka ha nāb͕a ọsọ.

5. Ọ nēcheta ndi-ebube-ya: ha su ngọngọ n'ojije-ha, me ngwa ijeru mb͕idi obodo, ma edoziwo ihe-nkpuchi ndi nānọchigide ya n'agha.

6. Emeghewo ọnu-uzọ-ama nile nke osimiri nile, ab͕azewo ulo uku ya.

7. Ekpughewo kwa Huzab, me ka ọ rigopu, ndi-orù-ya ndinyom nākwa kwa ákwá dika olu nduru, nēti obi-ha aka.

8. Ma Nineve di ka ọdọ-miri juputara na miri site n'ubọchi nile ya onwe-ya di: ma ndi ahu nāb͕alaga; Guzonu, guzonu, ka ha nāsi; ma ọ dighi onye nāgha anya n'azu.

9. Lutanu ọla-ọcha n'agha lutanu ọla-edo n'agha: ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù edoziri edozi, bú ebube nke sitere n'ihe nile anāchọsi ike.

10. Ọ bu ihe tọb͕ọrọ n'efu, na ihe awusiri dika miri, na ihe ab͕abara ọtọ: obi alọwo kwa miri, isu-ngọngọ nke ikperè abua di kwa, nb͕ali di kwa n'úkwù nile, iru ha nile achagharisiwo kwa.

11. Òle ebe ebe-obibi ọdum di? ebe-ita-nri ka ọ bu-kwa-ra umu-ọdum, ebe ọdum na nne-ọdum na nwa-ọdum jeghariri, ọ dighi kwa onye nēme ka ha ma jijiji.

12. Ọdum nādọb͕u anu gēzuru umu-ya, ọ nātọb͕uta-kwa-ra nne-ọdum-ya nile anu, we kpojue ọb͕à-ya nile n'anu-ndọb͕u, kpoju kwa ebe-obibi-ya nile n'anu ọ dọb͕uworo.

13. Le, Mu nēmegide gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēsure kwa ub͕ọ-ala-ya n'anwuru-ọku, ọ bu kwa umu-ọdum-i ka mma-agha gēripia: M'gēbipu kwa anu-ndọb͕u-gi n'uwa, agaghi-anu kwa olu ndi-ozi-gi ọzọ.

About Nehum Chapter 2

Read Nehum Chapter 2 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Nehum in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Nehum
Chapter: 2
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Nehum. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Nehum Chapter 2 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Nehum Chapter 2?

Nehum Chapter 2 is part of the Book of Nehum in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Nehum Chapter 2 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Eklisiastis Chapter 2

Explore More from Ne Hum

  1. Nehum Chapter 1
  2. Nehum Chapter 3

Related Chapters & Readings

  1. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 7
  2. Ọlu Ndi-Ozi Chapter 24
  3. Aisaia Chapter 22
  4. Ezikiel Chapter 18
  5. Matiu Chapter 2
  6. Aisaia Chapter 61
  7. I. Samuel Chapter 30
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *