Esta Chapter 4

For English

Read Esta Chapter 4 Online

Read Esta Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Esta in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Esta and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

A+ A A-

Esta 4

Isi 4

1. Ma Mọdekai mara ihe nile emere, Mọdekai we dọwa uwe-ya nile, yikwasi ákwà-nkpe, kpokwasi ntu n'aru-ya, pua je n'etiti obodo, tie oké nkpu di ilu:

2. o we bia rue n'iru ọnu-uzọ-ama eze: n'ihi na ọ dighi onye gābà n'ọnu-uzọ-ama eze n'uwe nke ákwà-nkpe.

3. Ọzọ, n'ala nile ọ bula anāchi achi, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, oké iru-újú ndi-Ju, na obubu-ọnu, na ikwa-ákwá, na iti-aka-n'obi; atusa-kwa-ra ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ọtutu madu.

4. Umu-ab͕ọghọ Esta na ndi-onozi-ya we bia gosi ya; o we nēb͕u nwunye eze ahu nb͕u n'obi nke-uku; o we zìe uwe iyikwasi Mọdekai, na iwezuga ákwà-nkpe-ya n'aru-ya: ma ọ naraghi ha.

5. Esta we kpọ Hatak, bú otù onye nime ndi-onozi eze, onye eze mere ka o guzo n'iru ya, o we nye ya iwu ijekuru Mọdekai, imara ihe nka bu, na ihe kpatara nka.

6. Hatak we pukuru Mọdekai rue amá obodo ahu, nke di n'iru ọnu-uzọ-ama eze.

7. Mọdekai we gosi ya ihe nile mere ya, kọ-kwa-ra ya isi ego ahu nke Heman siri na ọ gātù nye n'ulo-àkù eze n'ihi ndi-Ju, ime ka ha la n'iyì.

8. Ọzọ, ndeputa odide-akwukwọ iwu ahu nke enyere nime Shushan ikpochapu ha, o nyere ya ya, ime ka Esta hu ya, na igosi ya; na inye ya iwu ibakuru eze, iriọ ya aririọ-amara, na ichọrọ ndi-ya ihe n'iru ya.

9. Hatak we bia gosi Esta okwu Mọdekai nile.

10. Esta we gwa Hatak okwu, nye ya iwu inye Mọdekai, si:

11. Ndi-orù nile nke eze, na ndi ala anāchi achi nke eze, mara, na nwoke ọ bula, ma-ọbu nwayi ọ bula, nke gābakuru eze, rue ogige di ime-ime, bú onye anākpọghi, otù iwu-ya bu ka eme ka ha nwua, nāgughi onye eze nēsetiri nkpa-n'aka ọla-edo, ka ọ di ndu: ma akpọghi mu onwem ibakuru eze orú ubọchi na iri ndia.

12. Ha we gosi Mọdekai okwu Esta nile.

13. Mọdekai we si ha zaghachi Esta, si, Ekwula na nkpuru-obi-gi na i gēwepuga onwe-gi n'ulo eze, kari ndi-Ju nile.

14. N'ihi na ọ buru na i b͕a nkiti ghara ikwu okwu ọ bula na mb͕e a, oghere na nnaputa gēguzoro ndi-Ju site n'ebe ọzọ, ma agēme ka gi onwe-gi na ulo nna-gi la n'iyì: ma ònye mara ma ọ bu n'ihi mb͕e di otú a ka i biaruru ala-eze?

15. Esta we si ha zaghachi Mọdekai okwu, si,

16. Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.

17. Mọdekai we gabiga, me dika ihe nile si di nke Esta nyere ya n'iwu.

About Esta Chapter 4

Read Esta Chapter 4 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Esta in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Esta
Chapter: 4
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Esta. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Esta Chapter 4 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Esta Chapter 4?

Esta Chapter 4 is part of the Book of Esta in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Esta Chapter 4 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from esta

  1. Esta Chapter 4
  2. Esta Chapter 1
  3. Esta Chapter 3
  4. Esta Chapter 7
  5. Esta Chapter 2
  6. Esta Chapter 9
  7. Esta Chapter 6

Related Chapters & Readings

  1. Abù Ọma Chapter 123
  2. Zekaraia Chapter 8
  3. Zekaraia Chapter 9
  4. Zekaraia Chapter 7
  5. Jenesis Chapter 8
  6. Ilu Chapter 9
  7. I. Samuel Chapter 8
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *