II. Timọti Chapter 3

For English

Read II. Timọti Chapter 3 Online

Read II. Timọti Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Timọti in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of II. Timọti and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

II. Timọti 3

Isi 3

1. Ma mara nka, na oge di oké egwu gābia na mb͕e ikpe-azu.

2. N'ihi na madu gābu ndi nāhu nání onwe-ha n'anya, ndi nāhu ego n'anya, ndi nānya isi, ndi-npako, ndi-nkwulu, ndi nēkweyeghi ndi muru ha, ndi nēnweghi ekele, ndi nādighi ọcha n'obi,

3. ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nādighi-ab͕a ndu, ndi nēbo ebubo ugha, ndi nādighi-ejide onwe-ha, ndi di ka anu-ọhia, ndi nādighi-ahu ezi ihe n'anya,

4. ndi nārara madu nye n'aka ndi-iro-ha, ndi-isi-ike, ndi afuliworo elu, ndi nāhu ihe-utọ n'anya kama ihu Chineke n'anya;

5. ndi nēnwe udi nke nsọpuru-Chineke, ma ha agọwo ike-ya: gi b͕akuta kwa ndia azu.

6. N'ihi na ha sitere na ndia, bú ndi nēb͕ebà nime ulo di iche iche, nādọta kwa ndinyom nēnweghi uche n'agha, bú ndi ekpokwasiworo ha nmehie, ndi agu ihe ọjọ di iche iche dufuworo,

7. ndi nāmu ihe mb͕e nile, ma ha apughi ibiaru imazu ezi-okwu mb͕e ọ bula.

8. Ma otù uzọ ahu Janis na Jambris guzogidere Moses, otú a ka ndia nēguzogide kwa ezi-okwu ahu; bú madu ndi mebiworo n'uche, ndi ajuru aju n'ihe bayere okwukwe-ayi.

9. Ma ha agaghi-aga n'iru kari: n'ihi na enweghi-uche-ha gāputasi ìhè nye madu nile, dika enweghi-uche nke ndi ahu putakwara.

10. Ma gi onwe-gi soro ozizím, omumem, ihe m'zubere, okwukwem, ogologo-ntachi-obim, ihu-n'anyam, ntachi-obim,

11. nsob͕um nile, ahuhum nile; aha ihe dakwasirim n'Antiọk, n'Aikọniọm, na Listra; aha nsob͕u m'nagidere: Onye-nwe-ayi dọputa-kwa-ram nime ha nile.

12. E, agēsob͕u kwa ndi nile ndi nāchọ idi ndu n'uzọ isọpuru Chineke nime Kraist Jisus.

13. Ma ajọ madu nile na ndi-aghughọ gānaga n'iru n'ijọkari njọ, nēduhie ndi ọzọ, anēduhie kwa ha.

14. Ma gi onwe-gi, nọgide nime ihe nile i mutara, nke eme-kwa-ra ka i kwere ha, ebe i matara madu ndi i mutara ha n'ọnu-ha;

15. ebe i ma-kwa-ra na i sitere n'oge i di na nwa ọhu mata ihe di nsọ nile edeworo n'akwukwọ nsọ nke puru ime ka i buru onye-amam-ihe inata nzọputa site n'okwukwe nke i kwere na Kraist Jisus.

16. Ihe ọ bula edeworo n'akwukwọ nsọ bu ihe si n'obi Chineke puta, ọ ba-kwa-ra urù iji zí ihe, na iji tu madu nmehie-ha n'anya, na iji me ka uche madu guzozie, na iji zùputa nzùputa nke di n'ezi omume:

17. ka onye nke Chineke we zue okè, onye emeworo ka o zue okè ilu ezi ọlu nile ọ bula.

About II. Timọti Chapter 3

Read II. Timọti Chapter 3 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of II. Timọti in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: II. Timọti
Chapter: 3
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading II. Timọti. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading II. Timọti Chapter 3 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is II. Timọti Chapter 3?

II. Timọti Chapter 3 is part of the Book of II. Timọti in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete II. Timọti Chapter 3 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Jọn Chapter 1
  2. Nkpugh Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 10
  5. Nkpugh Chapter 13
  6. Nkpugh Chapter 7
  7. Nkpugh Chapter 6

Explore More from ii Timọti

  1. II. Timọti Chapter 4
  2. II. Timọti Chapter 2
  3. II. Timọti Chapter 1

Related Chapters & Readings

  1. Nehemaia Chapter 12
  2. Ezikiel Chapter 19
  3. Malakai Chapter 4
  4. Zekaraia Chapter 2
  5. Aisaia Chapter 23
  6. Aisaia Chapter 8
  7. Ndi Efesọs Chapter 5
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *