I. Pita Chapter 1

For English

Read I. Pita Chapter 1 Online

Read I. Pita Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Pita in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of I. Pita and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

I. Pita 1

Isi 1

1. Pita, onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi arọputaworo ndi bi dika ọbìa n'etiti Nb͕asa ahu nime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia,

2. ndi arọputaworo dika ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara si di, nime ido-nsọ nke Mọ Nsọ, ka unu we ṅa Jisus Kraist nti, ka ewe fesa kwa unu ọbara-Ya: Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo.

3. Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite,

4. ka ayi we keta nketa nke anāpughi imebi, nke anādighi-emeru kwa emeru, nke nādighi-atalata kwa, nke edebeworo n'elu-igwe nye unu,

5. ndi ewere ike nke Chineke nēche nche site n'okwukwe rue nzọputa nke edoziworo ikpughe n'oge ikpe-azu.

6. Nke obi nātọ unu utọ nke-uku nime ya, ọ bu ezie na emere ka o wuta unu n'ọnwunwa di iche iche nwa oge ub͕u a, ma asi na ọ di nkpà,

7. ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist:

8. Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto:

9. ebe unu nānata ihe okwukwe-unu gēweta, bú nzọputa nke nkpuru-obi-unu.

10. Ọ bu kwa nzọputa nka ka ndi-amuma chọrọ, nyocha kwa ihe bayere ya, bú ndi buru amuma bayere amara ahu nke gēru unu:

11. nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha.

12. Ndi ekpughere nye, na ọ bughi onwe-ha, kama ọ bu unu, ka ha ji ihe ndia jere ozi, bú ihe nke akọrọ unu ub͕u a site n'ọnu ndi ahu ndi zìri unu ozi ọma nka nime Mọ Nsọ eziputara n'elu-igwe; ihe ọ nāgu ndi-mọ-ozi inyocha ha.

13. N'ihi nka kenu ihe-ọkiké a n'úkwù nke uche-unu, nwe-kwa-nu anya-udo, lezu-kwa-nu anya okè n'amara nke anēwetara unu nime nkpughe nke Jisus Kraist;

14. dika umu nke iṅa-nti, unu eme-kwa-la onwe-unu ka unu di ka agu ihe ọjọ ahu si di, bú nke guru unu na mbu n'amaghi-ihe-unu:

15. kama dika Onye kpọrọ unu di nsọ, unu onwe-unu, ghọ-kwa-nu ndi di nsọ n'ibi-obi nile di iche iche;

16. n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Unu gādi nsọ; n'ihi na nsọ ka Mu onwem di.

17. Ọ buru kwa na unu akpọku Ya dika Nna, bú Onye nēkpe ikpé dika ọlu madu nile n'otù n'otù si di nēleghi madu anya n'iru, nēbinu obi n'egwu n'oge unu bi dika ọbìa:

18. ebe unu matara na ejighi ihe apuru imebi, bú ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo, b͕aputa unu n'ibi-obi efu unu nke nna-unu-hà nyere unu n'aka ibi;

19. kama eji ọbara di oké ọnu-ahia, dika nke nwa-aturu nke ọlu ma-ọbu ntupọ nādighi ya n'aru, bú ọbara nke Kraist:

20. Onye eburu uzọ mara n'ezie mb͕e akātọghi ntọ-ala nke uwa, ma emere ka Ọ puta ìhè n'ọgwugwu oge ndia n'ihi unu,

21. ndi sitere n'aka-Ya buru ndi kwere na Chineke, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, we nye Ya ebube; ka okwukwe-unu na olile-anya-unu we di n'ebe Chineke nọ.

22. Ebe unu meworo nkpuru-obi-unu ka ha di ọcha n'iṅa-nti nke unu ṅara ezi-okwu, iwere ihu-n'anya nke iru-abua nādighi ya hu umu-nna-unu n'anya, sitenu n'obi-unu hurita onwe-unu n'anya si-ike:

23. ebe amuworo unu ọzọ, esiteghi na nkpuru apuru imebi, kama esitere na nke anāpughi imebi, site n'okwu Chineke, nke di ndu, nke nādigide kwa, mu unu ọzọ.

24. N'ihi na, Anu-aru nile di ka ahihia, Ebube-ya nile di kwa ka uzari ahihia. Ahihia akpọnwuwo, uzari-ya adapuwo kwa:

25. Ma okwu Onye-nwe-ayi nādigide rue mb͕e ebighi-ebi. Nka bu kwa okwu nke ozi ọma ahu ezisara unu.

About I. Pita Chapter 1

Read I. Pita Chapter 1 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of I. Pita in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: I. Pita
Chapter: 1
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading I. Pita. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading I. Pita Chapter 1 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is I. Pita Chapter 1?

I. Pita Chapter 1 is part of the Book of I. Pita in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete I. Pita Chapter 1 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 13

Explore More from i-pita

  1. I. Pita Chapter 5
  2. I. Pita Chapter 3
  3. I. Pita Chapter 2
  4. I. Pita Chapter 4

Related Chapters & Readings

  1. Levitikọs Chapter 19
  2. I. Ndi-Eze Chapter 11
  3. II. Ihe Emere Chapter 21
  4. I. Samuel Chapter 28
  5. Abù Ọma Chapter 53
  6. Abù Ọma Chapter 136
  7. Nehum Chapter 1
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *