Esta Chapter 8

For English

Read Esta Chapter 8 Online

Read Esta Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Esta in the Old Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Esta and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Esta 8

Isi 8

1. N'ubọchi ahu eze, bú Ahasuerọs, nyere Esta, bú nwunye eze, ulo Heman, bú onye nākpab͕u ndi-Ju. Ma Mọdekai biara n'iru eze; n'ihi na Esta gosiri ka ya na ya si di.

2. Eze we wezuga nb͕a-aka-ya, nke o mere ka ọ ghara idi n'aka Heman, o we nye ya Mọdekai. Esta we do Mọdekai onye-isi ulo Heman.

3. Esta we kwu kwa ọzọ n'iru eze, da n'ala n'iru ukwu-ya abua, kwa ákwá, riọ ya aririọ-amara, bú ka o me ka ihe ọjọ Heman, bú onye Egag, na èchìchè-ya nke o chère megide ndi-Ju gabiga.

4. Eze we setipuru Esta nkpa-n'aka ọla-edo ya. Esta we bilie, guzo n'iru eze,

5. si, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na ahutawom amara n'iru ya, ọ buru kwa na okwu a ziri ezi n'iru eze, ọ buru kwa na mu onwem adi nma n'anya-ya, ka ede ya n'akwukwọ iweghachi akwukwọ, bú èchìchè Heman nwa Hamedata onye Egag, nke o dere ime ka ndi-Ju la n'iyì, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze.

6. N'ihi na #m'gēsi aṅa pu inagide ya mb͕e m'huru ihe ọjọ nke nābiakwasi ndim? #m'gēsi kwa aṅa pu inagide ya mb͕e m'huru ila-n'iyì umu-nnam?

7. Eze, bú Ahasuerọs, we si Esta, bú nwunye eze, si kwa Mọdekai, bú onye-Ju, Le, ulo Heman ka m'nyere Esta, nwoke ahu ka ha kwuba-kwa-ra n'elu osisi, n'ihi na o setiri aka-ya megide ndi-Ju.

8. Unu onwe-unu kwa, denu akwukwọ bayere ndi-Ju, dika o si di nma n'anya-unu, n'aha eze, were-kwa-nu nb͕a-aka-akàrà eze kà ya: n'ihi na odide-akwukwọ nke edeworo n'aha eze, nke ewerewo-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, ọ dighi onye puru ichighari ya.

9. Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n'ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n'ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n'India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di.

10. O we de akwukwọ n'aha eze, bú Ahasuerọs, were nb͕a-aka-akàrà eze kà ya, zìga akwukwọ n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya nēbu, bú ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule na umu-inyinya nēbu:

11. bú akwukwọ nke eze kwere nime ha ka ndi-Ju ndi nọ n'obodo nile ọ bula kpọkọta onwe-ha, guzo kwa n'ihi ndu-ha, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ha la n'iyì, bú usu-ndi-agha nile nke ndi ahu na ala ahu anāchi achi ndi nākpab͕u ha, ma umu-ntakiri-ha, ma ndinyom-ha, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha,

12. n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, n'otù ubọchi, bú n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.

13. Ndeputa odide-akwukwọ, nke agēnye dika iwu n'ala nile ọ bula anāchi achi, ekpughere ya nye ndi nile di iche iche, ka ndi-Ju nọ na njikere bayere ubọchi a, ibọrọ onwe-ha ọ́bọ̀ n'iru ndi-iro-ha.

14. Ndi-ọb͕a-ọsọ ndi inyinya ukwu ọsọ na inyinya mule nēbu puru, ebe ewere okwu eze kwalie ha, me ka ha me ngwa; enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze.

15. Mọdekai we si n'iru eze pua n'uwe ala-eze nke ákwà anunu na ezi ákwà ọcha, ya na okpu-eze ọla-edo di uku, na uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha na ákwà ododo: obodo Shushan we tie nkpu ṅuri kwa ọṅu.

16. Ndi-Ju nwere ìhè, na ọṅù, na obi-utọ na nsọpuru.

17. N'ala nile ọ bula anāchi achi, na n'obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n'ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.

About Esta Chapter 8

Read Esta Chapter 8 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Esta in the Old Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Esta
Chapter: 8
Testament: Old Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Esta. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Esta Chapter 8 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Esta Chapter 8?

Esta Chapter 8 is part of the Book of Esta in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Esta Chapter 8 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ochie

  1. Aisaia Chapter 1
  2. Esta Chapter 1
  3. Ilu Chapter 11
  4. Ilu Chapter 12
  5. Jenesis Chapter 13
  6. Emos Chapter 1
  7. Jenesis Chapter 5

Explore More from esta

  1. Esta Chapter 2
  2. Esta Chapter 1
  3. Esta Chapter 4
  4. Esta Chapter 10
  5. Esta Chapter 5
  6. Esta Chapter 1
  7. Esta Chapter 6

Related Chapters & Readings

  1. Ndi Rom Chapter 5
  2. Zekaraia Chapter 8
  3. II. Samuel Chapter 8
  4. Abù Ọma Chapter 101
  5. Nkpugh Chapter 3
  6. Joshua Chapter 11
  7. Esta Chapter 9
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *