Nkpugh Chapter 9

For English

Read Nkpugh Chapter 9 Online

Read Nkpugh Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Nkpugh in the New Testament. Browse every verse with easy chapter navigation, continue to the next chapter, or explore the complete Book of Nkpugh and the Holy Bible online.

Choose a Chapter

Nkpugh 9

Isi 9

1. Mọ-ozi nke-ise we fùa opì, m'we hu kpakpando nke sitereri n'elu-igwe da n'uwa: ewe nye ya nkpisi-ugodi nke olùlù nke abyss ahu.

2. O we meghe olùlù nke abyss ahu; anwuru-ọku we si n'olùlù ahu kwugo, dika anwuru-ọku nke oké ọku; anyanwu na mbara-elu-igwe we site n'anwuru-ọku nke olùlù ahu b͕a ọchichiri.

3. Igurube we si n'anwuru-ọku ahu puta je n'uwa; ewe nye ha ike, dika akpi nke uwa nwere ike.

4. Ewe gwa ha ka ha ghara imejọ ahihia nke uwa, ma-ọbu ihe ọ bula nwere akwukwọ ndu, ma-ọbu osisi ọ bula, ma ka ha mejọ nání madu, bú ndi ahu nēnweghi akàrà nke Chineke n'egedege-iru-ha.

5. Ewe nye ha ike ka ha ghara ib͕u ha, kama ka ewe mekpa ha aru ọnwa ise: nmekpa-aru-ha di ka nmeka-aru nke akpi, mb͕e ọ bula ọ nāb͕a madu.

6. N'ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha.

7. Oyiyi igurube ahu yiri inyinya edoziworo ije agha; n'isi-ha ka ha nēkpu ihe dika okpu-eze yiri ọla-edo, iru-ha di kwa ka iru madu.

8. Ha nwe-kwa-ra agiri-isi dika agiri-isi ndinyom, ezé-ha di kwa ka ezé ọdum.

9. Ha nwe-kwa-ra ihe-agha ib͕ochi obi, dika ihe-agha ib͕ochi obi nke ígwè; nkpatu nkù-ha di kwa ka nkpatu nke ub͕ọ-ala, nke ọtutu inyinya nāb͕a ọsọ ije agha.

10. Ha nwe-kwa-ra ọdudù yiri ọdudù akpi, nwe ihe-ọb͕ub͕a; nime ọdudù-ha ike-ha di imejọ madu ọnwa ise.

11. Ha nwere mọ-ozi ahu nke abyss ahu dika eze-ha: aha-ya n'asusu Hibru bu Abadon, n'asusu Grik o nwe-kwa-ra aha Apọlion.

12. Ahuhu mbu agabigawo: le, ahuhu abua ọzọ fọduru ibia, mb͕e ihe ndia gasiri.

13. Mọ-ozi nke-isi we fùa opì, m'we nu otù olu nke si na mpi nke ebe-ichu-àjà ahu eji ọla-edo me puta, bú nke di n'iru Chineke,

14. M'we nu otù onye, ka ọ nāgwa mọ-ozi nke-isi ahu okwu, bú onye nwere opì ahu, si, Tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu ndi ekeworo ab͕u n'osimiri uku Yufretis.

15. Ewe tọpu ndi-mọ-ozi anọ ahu, ndi edoziriri nye oge hour na ubọchi na ọnwa na arọ ahu, ka ha we b͕ue otù uzọ n'uzọ atọ nke madu.

16. Ọnu-ọgugu usu-ndi-agha ahu, nke bu ndi-inyinya, di ọgu million iri: anurum ọnu-ọgugu-ha.

17. Otù a ka m'hu-kwa-ra inyinya ahu n'ọhù ahu, ha na ndi nānọkwasi ha, nēnwe ihe-agha ihe-agha ib͕ochi obi nke yiri ọku na hyacinth na brimstone: isi inyinya ahu di kwa ka isi ọdum; ọku na anwuru-ọku na brimstone nēsi kwa n'ọnu-ha puta.

18. Esitere n'ihe-otiti atọ ndia b͕u otù uzọ n'uzọ atọ nke madu nile, ya bu site n'ọku ahu na anwuru-ọku ahu na brimstone ahu, nke nēsi n'ọnu-ha puta.

19. N'ihi na ike inyinya ahu di n'ọnu-ha, di kwa n'ọdudù-ha: n'ihi na ọdudù-ha yiri agwọ, nwe kwa isi; ha were kwa ha nēmejọ.

20. Ma ndi fọduru n'etiti madu, ndi anēb͕ughi n'ihe-otiti ndia, echègharighi isi n'ọlu nile nke aka-ha puta, ka ha we ghara ikpọ isi ala nye ndi-mọ ọjọ, ha na arusi-ha nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke nāpughi ile ihe anya, ma-ọbu inu ihe, ma-ọbu ije ije:

21. ha echègharighi kwa isi n'ib͕u-madu-ha, ma-ọbu n'igwọ-nsi-ha, ma-ọbu n'ikwa-iko-ha, ma-ọbu n'izu-ori-ha, puta.

About Nkpugh Chapter 9

Read Nkpugh Chapter 9 online from the Holy Bible. This chapter is part of the Book of Nkpugh in the New Testament. Continue reading with the chapter navigation above or explore the complete book.

Book Information

Book: Nkpugh
Chapter: 9
Testament: New Testament

How to Read this Chapter

Use the Previous and Next Chapter buttons to continue reading Nkpugh. You can also adjust the font size for comfortable reading and browse other books of the Bible using the navigation links.

https://www.youtube.com/watch?v=rzsT_Q3KLzE

More Resources

Continue Reading the Bible

Continue reading Nkpugh Chapter 9 and explore every book, chapter and verse of the Holy Bible. Use the navigation links above and below to move through the Scriptures with ease.

Frequently Asked Questions

What is Nkpugh Chapter 9?

Nkpugh Chapter 9 is part of the Book of Nkpugh in the Holy Bible.

Can I read this chapter online?

Yes. You can read the complete Nkpugh Chapter 9 online for free with easy chapter navigation.

More Chapters from Agba Ọhụrụ

  1. Nkpugh Chapter 4
  2. Jọn Chapter 1
  3. Nkpugh Chapter 14
  4. Nkpugh Chapter 1
  5. Nkpugh Chapter 10
  6. Nkpugh Chapter 6
  7. Nkpugh Chapter 13

Explore More from nkpugh

  1. Nkpugh Chapter 19
  2. Nkpugh Chapter 21
  3. Nkpugh Chapter 8
  4. Nkpugh Chapter 2
  5. Nkpugh Chapter 12
  6. Nkpugh Chapter 20
  7. Nkpugh Chapter 10

Related Chapters & Readings

  1. I. Ndi-Eze Chapter 1
  2. II. Ndi-Eze Chapter 8
  3. Ndi Kọlọsi Chapter 1
  4. I. Ihe Emere Chapter 1
  5. II. Ihe Emere Chapter 4
  6. Matiu Chapter 24
  7. II. Ihe Emere Chapter 35
Share Your Love

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *